Ụwa mgbede ka mma

Ụwa mgbede ka mma

Ụwa mgbede ka mma!
Okwu ndị mbụ na ndị egede 
Ihe okenye nọ ala hụ nwata kwụrụ ọtọ ma ya ahụla ya
A na-agbanụ agbanụ aracha aka a ga-afanye ya n'uko
Gbanụ gbanụ gwujie ji ama tukwuru ala chọwa ọdụ ya
Ụwa mgbede ka mma!

Ị makwa na ụkwa ruo oge ya ọ daa
Anụ gbala taata echi ka bụkwa nta
Ụwa mgbede ka mma!
Ọ na-abụ a rụọ n'anwụ e rie na ndo
Ọ bụ nkụ onye kpara n'ọkọchị ka ọ ga-anya n'udumiri
Ụwa mgbede ka mma!
O jije ejije nyụchie nsị ụzọ chetakwa na ọ lawa alawa ọgụ abụrụ nke ya na ụmụ ijiji
Onye sie rie ya biko sachapụ ite ya debe maka echi na
Ụwa mgbede ka mma!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!
©️Emeka Agbaka 2018

A gụọla ya ugboro 785

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!