Nnewi

Nnewi bụ ala Igbo Nnewi bụ ala Igbo igbogaadi.org

Nnewi so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Dịka agụgụala na akụkọ ọnụ ndị Nnewi siri kọ, o gosiri na ewi nyere nnukwu aka na-ịzọpụta ndị guzobere Nnewi n'oge agha ndị Nnewi. N'ime agụgụala Nnewi niile bụ usoro agha ahụ ka Nnewi ji nwe mmeri ilekọta oke ala Nnewi anya. Otu a ka e siri machibido igbu ma ọ bụ iri ewi na Nnewi ruo taa. Nnewi bụ obodo kwụụrụ onwe ya bido na narị afọ nke iri na ise (15th Century) ruo n'afọ iri na itolu na anọ (1904), mgbe ndị ọbịarachịwa weghara ọchịchịeze ha.

Nnewi nwere ebo anọ (mkpu n’anọ), nke ọ bụla n’ime ha bu nnukwu obodo. Ha bụ Otolo, Uruagụ, Ụmụdim na Nnewichi. E kere ebo (maọbụ mkpu) ọ bụla n’ime ụmụnna dị iche iche. Ebo (maọbụ mkpu) ọ bụla nwekwara ezinụlọ mbụ ndị nke na-abụ isi Obi.  Ebo anọ ahụ bụkwanụ aha ụmụ anọ Edo mụtara bido n’ Otolo bụ di ọkpara wee ruo na Nnewichi bụ ọdụdụ.

Edo bụ arụsị kachasị arụsị nille dị n’ala Anaedo. Ihu arụsị a nke na-ejikọta arụsị niile dị n’ime Nnnewi dị na nkwọ Nnewi nke bụ isi ahịa na Nnewi. E nwere ụzọ arụsị anọ dị na Nnewi aha ha bụ Ana, Ezemewi, Eze na Ele. Nwa bekee webatara ụka na Nnewi n'afọ iri na asatọ na iri asatọ na ise (1885) nke mere na taata ọtụtụ ndị Nnewi bụzi ndị ụka. Ha dị obodo atọ bụ ụmụ Anaedo, Nnewi, Ichi na Oraifite. Ka ha hara bụrụ ụmụ Anaedo nwere otu nna nna, otu nkwenye na otu usoro agụgụ ọdịnala.

E nwere Obi n’ime ebo (maọbụ mkpu) anọ dị na Nnewi. Igwe Kenneth Orizu nke atọ bụ Obi Otolo nakwa Igwe Nnewi. Ya kachasị Obi atọ ndị ọzọ bụ Chief Nnamdị Obi onye bụ Obi Uruagụ, Obi Bennett Ọkafọ bụ Obi Ụmụdim nakwa Obi George Onyekaba bụ Obi Nnewichi. Ihe e jiri mara Obi anọ ndị a bụ Igwe-in-Council nke Igwe Orizu nke atọ bụ onye isi oche ha. Ọ bụ ha na-ahụ maka ihe ezighị ezi, maka ọdịnala nakwa okwu obodo na Nnewi. A naghị enyefe mmadụ Igwe maọbụ Obi enyefe na Nnewi. A naghị ahọpụta ha ahọpụta kama ọmụmụ ka a na-amụ ha. Ọ bụ ka iwu ọdịnala Nnewi siri debe ya.

Ihe e jiri mara ndị Nnewi bụ azụmahịa na ọrụ ugbo. Ọ bụ n’ihe abụọ ka hiwere nnukwu aha, Nnewi a na-anụ anụ. Ha na akọta ọtụtụ ihe ubi nke ha na-ere ụfọdụ n’ime ha ere ma rie ụfọdụ erie. Akụkụ ihe ubi ndị ha na-ere ere gụnyere mmanụ nkwụ, ahịhịa ngwọ, egwusi, owu, koko, rọba, ọka, wdg. Akụkụ ihe ubi ndị ọzọ ha na-akọta ebe ọ bara ụba bụ  ji, akpụ, ụkwa, ede wdg.

Nnewi nwere nnukwu emume e jiri mara ha nke a na-akpo ọfala Nnewi.  Ọfala Nnewi bụ emume a na-eme kwa afọ maka ncheta echichi Igwe Nnewi. Afịaọlụ (Ahịaọrụ) bukwa emume ọzọ a n-eme kwa afọ a ma ama nke bu emume ri ji ọhụrụ. Ikwuarụ sokwa n’ememụ ọdịnala a na-eme kwa afọ na Nnewi.

Azụmahịa ndị Nnewi gbadokarịrị ụkwụ na-ire akụkụ ụgbọala na nke ọgbatumtum dị iche nke a kpọrọ "Spare Parts" na Bekee. Nke a mere Ahịa akụkụ ụgbọala na nke ọgbatumtum na Nnewi jiri bụrụ nnukwu ọgbọ azụmahịa maka ire akụkụ ụgbọala na nke ọgbatumtum dị iche nke kacha na Naịjirịa nakwa ọdịda anyanwụ Afrịka. Ndị Nnewi jiri n’ihi nke a wube ọtụtụ ụlọ ọrụ, ma ndị obere ma ndị nnukwu na-emepụta akụkụ ụgbọala na nke ọgbatumtum ebe ọ dị iche iche. Ụlọ ọrụ ndị a anaghị emepụta ngwa ahịa ndị a nanị maka ahịa Naịjirịa kamakwa maka ahịa ndị mba ofesi. Ha bidoro ịrụpụta ngwa ahịa bụ ọkpọka kamgbe iri afọ na itolu na iri asaa (1970) kama ha isi mba ofesi ebubata akụkụ ụgbọala na nke ọgbatumtum bụ adịgboroja. Ahịa dị iche iche jupụtara Nnewi, ahịa ndị dịka Agbọ-Edo motor spare parts, ahịa Nwagbala, Ahịa Generator parts, Ahịa Electrical parts, Nkwọ Nnewi general (Ime Afia), Ahịa Timber dealers (Ọgbọ osisi), Ahịa Nwafọ, Eke Amaobi, Eke Ochie, Eke Ichi, Ahịa Orie otube, Ahịa Okpunoegbu wdg.

Nnewi nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ na-arụpụta ezigbo ngwa ahịa dị iche iche nke ụfọdụ n’ime ha bụ Ibeto Group of Companies, Cutix & ADswitch, Uru Industries Ltd, Omata Holdings Ltd, Cento Group of Companies, Coscharis of Companies Group, Innoson Group of Companies, Ebunso Nig. Ltd, John White Industries, Ejiamatu Group of Companies, Chicason Group, Louis Carter Group, wdg. Na Nnewi ka e nwere ụlọ ọrụ mbụ na-arụpụta ụgbọ ala na Naịjirịa nke a maara dị ka Innoson Vehicle Motor (IVM).  Ọgbatumtum mbụ arụrụ na Nigeria bụkwa ụlọ ọrụ National Agency for Science and Engineering Infrastructure (NASENI) dị na Nnewi rụpụtara.

Ihe ọzọ e jiri mara ndị Nnewi bụ na ha nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ ụgbọ njem (transportation) nakwa ụlọ ọrụ ụgbọ mbupu ibu (logistic) kamgbe agha ụwa nke abụọ biri (2nd World War). Philip Ọdụmegwu Ojukwu bụ nna Ikemba Nnewi bụ otu n’ime ndị mbụ na Naịjirịa wubere ụlọ ọrụ ụgbọ njem na nke mbupu ibu. Kamgbe ahụ ka ọtụtụ ndị Nnewi ndị ọzọ jiri sonye. Ndị a bụ ụfọdụ ụlọ ọrụ ụgbọ njem na nke mbupu ibu ndị Nnewi nwere, Izuchukwu Nig. Ltd, Chi Dị Ebere Transport Ltd, Ekene Dịlị Chukwu Nig. Ltd, Ekeson Motors Ltd, Ijeọma Motors Nig. Ltd, Nsọedo Transport Ltd, Orizu Transport Limited, Bluebase Transport Solutions, Izu Ọkaka Anaedo Ltd, UBI Logistic and Transport Ltd, Nwa CHINEKE Ltd Door to Door Charter Service wdg.

Ihe ruru narị puku mmadụ itoolu bi na Nnewi (900,000).

Akọba ọkọ ka o si atọ ụtọ a kọpuo ahụ, ka anyị kwụsịgodị ebe a.

NNEWI BỤ E JI AMA ATỤ.

Nrụtụaka; Wikipedia 

 

A gụọla ya ugboro 1238

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!