Ọka(Awka)

Ọka bụ ala Igbo Ọka bụ ala Igbo igbogaadi.org

Ọka (Awka) so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

“O nwere ihe dị iche banyere Ọka, n’ihi na ọ bụ be ndị ọkpụ ụzụ kpụrụ ngwa ọrụ nke mere ka ịkọ ugbo dị irè” - Chinua Achebe

Ndị Ifiteana bụ ndị mbụ biiri n’Awka.Ihe Ifiteana pụtara bụ ndị si n’ala pulite. Ha bụkarịrị ndị ọrụ ugbo, ndị dinta, na ndị ọkpụ ụzụ. Ha bi n'akụkụ mmiri iyi Ogwugwu bụ ebe a ma ugbu a dịka mpaghara Nkwelle Ọka. Ifiteana nwere arụsị a na-akpọ Ọkịka na ube ma ọ bụ arụsị kanụ ji ube. Aha e jiri mara Ifiteana bụ Ụmụ Ọkanube ma ọ bụ ndị na-efe Ọkanube. E bidoro kpọbiriwe aha ha Ụmụ-Ọka ma mecha wepụzie ụmụ kpọwazie ha naanị Ọka. O ru mgbe ndị ụka bịara ha degharịa ya  “Awka” n’asụsụ bekee ka o wee dịrị ha mfe ọkpụkpọ.

E nwere ọtụtụ enyí na mpaghara Ọka dịka ebe a na-akpọ Amaenyi, n'oge ochie na-achụ nta enyí ebe ahụ. E nwekwara ọdọ mmiri a na-akpọ Iyienyi nke bụ ebe enyí ndị ahụ na-ezukọta añụ mmiri. Ndị Ọka na-achụ nta enyi maka ọdụ́ ya nke dị oke ọnụ ahịa nakwa dịka ihe ịrịrba ama Ọkanube.  Ha na-edebe ya n'ụlọ ọ bụla maka iji chekwaba ọgwụ ha ji achụ nta.

E mechara were maka ọrụ igwe chapụrụ achapụ na ịkpụ ụzụ mara Ọka na mpaghara niile dịka imepụta ngwa ọrụ ugbo, egbe na ihe emume ọdịnala dịka Oji na Ngwuagịlịja. Otu ihe ọzọ e jiri mara Ọka tupu ndị ọbịarachịwa abịa bụ òkwù arụsị Agbala nke e kwuru na ọ bụ ada nnukwu arụsị Ibini Ụkpabị nke Arọchukwu. Ndị mmadụ na-aga n'ụlọ arụsị Agbala maka idozi esemokwu wee ruo mgbe ndị ọbịarachịwa mebiri ụlọ arụsị ahụ na isimbido nke narị afọ iri abụọ (20th Century). Chinua Achebe metụkwara ya aka n’akwụkwọ ya bụ Things Fall Apart.

Tupu ọbịarachịwa abịa, ọ bụ ndị tozuru etozu a na-akpọ ndị Ọzọ na Ndịichie na-achị Ọka. Ha na-enwe nzukọ izugbe ma ọ bụ Izu Ọka ha n’ụlọ okenye bụ Ọtọchalụ Ọka ma ọ bụ ebe ọ bụla ọ kpọrọ aha. Ọka ka na echekwaba usoro ọchịchị ọdịnala ha ruo taata. Ndị Ọzọ na-ahụ maka nsogbu dị n’obodo ebe onye nnochite anya omenala bụ Eze Ụzụ. Ọ bụ ndị ọzọ nile na-ahọpụta Eze Ụzụ maka ịnọchite anya Ọka na mmemme niile. Nhọpụta Eze Ụzụ na-atụgharị n’etiti ogbe di iche iche n’ime Ọka. Eze Ụzụ a họpụtara n'afọ iri na itolu na iri itoolu na itoolu bụ Gibson Nwosu.  Ọ bụ otu n’ime ndị mbụ ewepụtara maka ndị agha ụgbọelu Naịjirịa ma bụrụkwa onye bụbu onye isi ndị ọrụ ụgbọelu na-ahụ maka ụgbọelu na Biafra Air Force.

Chetakwa na o nwere ihe dị iche na Ọka na Ọka etiti.

A gaghị akọcha akụkọ Ọka hapụ ịkọ maka mmemme IMO ỌKA!

A na-eme mmemme Imo Ọka kwa afọ n’ọnwa Mee nke na-egosi mbido oge ọrụ ugbo. Ihe mere Ọka ji eme mmemme Imo Ọka bụ iji eme ncheta arụsị nwanyị bụ onye a na-enwe olile anya na ọ ga-eme ka ala mepụta ihe ubi n’uju. Mmemme a na-amalite bido n’amanị ahụ ndị Ọka bu mmụọnwụ ga Ụmụokpu ma na-akwụsịkwa ụbọchị ikpeazụ ma ndị Ọka gaa na mmiri Imo Ọka. E nwere emume anọ gbara ọkpụrụkpụ a na-eme n’oge mmemme a, ha bụ ede mmụọ, ọgwụ ọghụgha, egwu Ọpụ Eke na Egwu Imo Ọka. Egwu Ọpụ Eke bụ egwu omenaala mara mma nke ụmụ nwanyị na-efe arụsị Imo Ọka na-agba. Ụmụ nwanyị na-achụrụ arụsị aja na ụmụ nwanyị nkịtị na-eke otu ụdịrị ekike bụ sọ mma pụọ ahịa ga gbaara mmụọ na-achịkwa arụsị Imo Ọka. Ụdị mmụọnwụ dị iche iche, ma ndị ọjọọ, ma ndị n-agụ na ndị na-agba egwu, ma ndị na-apịa ụtarị, ha niile na-agba na mmemme Imo Ọka. Ha kwenyere dịka omenala siri dị na mmụọnwụ ndị a bụ ndị mmụọ si n'ala ndị nwụrụ anwụ bịa ịnọchite anya ndị nna nna Ọka maka mmemme a.

Ọ bụrụ na ị bịabeghị mmeme Imo Ọka mbụ mara na ihe dị mma na-efunahụ gị ọ kachasị ma ọ bụrụ na ị ihe gbasara omenala Igbo na-adị gị mma. 

Ihe dị ka narị puku mmadụ atọ na otu na narị isii na iri ise na asaa (301,657) bi n’Ọka.

Kama Ọka ga-akwụsị ogene, ọrụ oyibo ala!

Nrụtụaka; Wikipedia

 

A gụọla ya ugboro 709

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!