Owere(Owerri)

Oweri bụ ala Igbo Oweri bụ ala Igbo igbogaadi.org

Owere (Owerri) so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Tupu ndị ọbịarachịwa abịa Owere n'afọ iri na itolu na otu (1901), Owere nwere ogbe ise nke bụ; Ụmụọrọrọnjọ, Amawọm, Ụmụonyeche, Ụmụọdụ na Ụmụọyịma.  Ọ bụ n’ihi ogbe ise a mere e ji akpọ ha Owere Nchi Ise.

Dịka akụkọ ihe mere eme, ụmụ amaala Owere kwere na agbụrụ ha si n’aka otu nwoke a na-akpọ Ekwem Arugo onye bụ nna nna ha na isimbido ndụ Owere.

Kamgbe ọbịarachịwa batara Owere n’isimbido narị afọ nke iri na iteghete (19th Century), Owere abụọla nnukwu isi obodo dịka na Divishion Owere nakwa n'okpuru Provinci Owere. Ya mere o jiri dị mfe ịhọpụta Owere dịka isi obodo mgbe ahụ e kere Imo State n’abalị atọ nke ọnwa Febụwarị n'afọ iri na itolu na iri asaa na isii (1976).

Onye na-achị Owere n’ụdị ọdịnala bụ Eze Owere. H.R.M Emmanuel Emenyonu Njemanze (Ozuruigbo nke ise)  bụ Eze ikpeazụ Owere nwere. Ọ hapụrụ n’abalị anọ n’ọnwa ọnwa Mee n'afọ puku abụọ na iri na isii (2016).

Ndị na-enyere Eze Owere aka n'ịhazi ihe niile  na-aga n’ala Owere bụ ndị isi ogbe ise dị n’ala Owere (Owere Nchi Ise) a na-akpọ ndị Kansụl Eze. Onye ọ bụla n’ime ha na-anọchite anya otu ogbe. E nwekwara Ọgbakọ ndị okenye (Elders Council) a na-akpọ Ọha Owere. Ha nwekwuru ọrụ dị mkpa ha na-arụ n'ala Owere. Ọ bụ ndị okenye a na-ekpe ikpe gbasara ala. Ụmụnna ọ bụla na-enwe naanị otu onye nnọchite anya n’ọgbakọ Ọha dịka omenaala Owere siri dị. Onye okenye tọchara n'ụmụnna na-eweghara ọnọdụ dị ka onye otu Ọha ma ọ bụrụ na onye Ọha si n’ụmụnna ha nwụọ.  A naghị azọ nhọpụta Ọha azọ dịka ọdịnala Owere siri dị. Ọ bụ nhọpụta dị nsọ ma bụrụkwa nwa tote o tokwuru.

Ụmụ amaala Owere na-eme emume a na-akpọ Ọrụ Owere ma ọ bụ Ọrụ Eze (mmemme eze) kwa afọ. Mmemme a na-abịakarị n’etiti ọnwa Junu na ọnwa Ọgọstụ. Ndị na-ekpebi ụbọchị a ga-ebido ya bụ emume bụ ndị Ọha Owere dịka omenala Owere siri kwụrụ. Oge a na-abụkarị oge udo ebe esemokwu dị nakwa oge ụmụ amaala Owere na-eme ncheta ntọala ha. Mmemme a na-ebido n’ugwu Ekwema (Community Civic Centre) mgbe Eze Owere wachara ọjị iji kpọku ndị mbụ na ndị egede. Nri a na-erikarị n’oge a bụ ji ochie a hụrụ ahụ bịa were mmanụ na ụgba hazie ya. Nri ọzọkwa a na-erikwu oge ahụ bụ nri ọka iji gosipụta ụdị nri nna mbụ Owere riri mgbe ọ bịarutere n'ala Owere.

Ọ dị mkpa ịkọwa ebe a na Ọrụ Owere abụghị emume iri ji ọhụrụ n’ihi na ụmụ amaala Owere anaghị eme emume iri ji ọhụrụ.

Owere nwere ezigbo ala ma na akọpụtakwa ọtụtụ ihe ubi dịka ji, akpụ, ọka, rọba na ihe nkwụ. Owere nwekwara mmanụ n'ime ala dịka ọtụtụ obodo n'ala Igbo.
Ọnụọgụ ndị bi na Owere ruru otu nde mmadụ, narị puku anọ na otu, narị asatọ na iri asaa na atọ. (1,401,873)

Nrụtụaka; Wikipedia

A gụọla ya ugboro 682

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!