Mkpụrụmmiri

Mkpụrụmmiri (Methamphetamin) Mkpụrụmmiri (Methamphetamin)

Ebe ahịhịa na-atọ ewu ụtọ dị ka nke na-egbu ya egbu na-adịkwu - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Mgbe ahụ elu bụ ala ọsa
Mgbe ụmụaka na-agba ògwó ògwó mmiri 
Mkpụrụmmiri daa ha atụtụrụ tụnye n'ọnụ
Mkpụrụmmiri ahụ agbazee n'ọnụ
Mgbe ụwa tọrọ ute

Kedụzi okenye gwara ụmụaka na mkpụrụmmiri bụ ọgwụ na-egbu karịa nkwụ elu udi
Ọhịa a bara bute ozu nza abụọ na ya mara na ihe na-egbu nza bi n'ọhịa ahụ
O nweghị ebe anwụrụ si apụta abọcha ya ka a ghara ịhụ ya ọkụ
Ozu siwe isi enyi ka nwanne alaa

Ụmụaka amaghị na ọ bụghị ka ihe nracha si amị
Ụmụaka amaghị na e jighị ihe e ji agba na ntị agba n'anya
Ụmụaka amaghị na a jụghị ajụ eri na-ebute arịaghị arịa anwụ
Ụmụaka amaghị na ebe ahịhịa na-atọ ewu ụtọ dị ka nke na-egbu ya egbu na-adịkwu
Ekwughị ekwu mere okenye ma anụghị anụ mere nwata

Nsogbu dịkwa maka na ofeke mụta ịta atụ osisi agwụ n'ọhịa
Ụnụ ahụla ebe nwa ụkpala na-ere n'ọkụ sị na ya na-aha mmanụ

Igbo teta nụ n'ụra maka na taa bụ gboo

Ndị mbụ na ndị egede gwara anyị na a gbaghị ụzọ owere mgba na ọ naghị echi
Ma kwuo na ọ bụrụ na e hughị awọ mmiri ọkụ na  ọ gaghị ama na mmiri dị ụzọ abụọ

Igbo ga-eji ehihie chụwa ewu ojii tupu chi ejie
Maka na ụ̀zọ́ bara uchichi aghọla mwemwe ọsọ

Tagboo bụ aha Igbo

Igbo chetakwa na ụtụtụ emeghị ngwa ngwa ehihie eburu ya ụzọ.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị

®Emeka E. Agbaka 2021

A gụọla ya ugboro 1119

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!