Nsụka(Nsukka)

Nsụka bụ ala Igbo Nsụka bụ ala Igbo igbogaadi.org

Nsụka (Nsukka) so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Nsụka dị na mgbago ugwu nke ala Igbo. Ha na ndị Kogi na Benue gbara agbata obi mana ndị ha na ha gbara agbata obi na Benue ka bụkwa ndị Igbo e jiri ndọrọndọrọ kewapụ n’ala Igbo kenye ha na Benue. Ndọrọndọrọ kewakwara ụfọdụ ndị Nsụka keba ha na Kogi. Nsụka na Ede, Opi, Ede-Ọbala na Obimo gbara agbata obi.

Nsụka nwere ọnụ ọgụ mmadụ ruru narị puku mmadụ anọ na iri (410,000).

Na Nsụka ka nnukwu mahadum Naịjirịa bụ University of Nigeria Nsụka (e jiri UNN n’aha mkpirisi mara) dị. UNN bụ mahadum nke mbụ nke ụmụ amaala Naịjirịa. Ọ bụ dọkịta Nnamdị Azịkiwe bụ onye isi ala mbu nke Naijiria guzobere ya bụ mahadum. Taata, Nsụka nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ gọọmentị etiti n’ime mahadum UNN dịka NABDA, CBSS, na ebe nyocha maka ọkụ eletrik.

Nsukka na-akọpụta ihe ubi dị ka, akpụ, ọka na Ijiriji (ndudu, ụzụakị - Nkanụ) ebe o hiri nne ma na-apịtakwa mmanụ nkwụ hinne. Ikwe akwa sokwa n’otu ọdịnala ndị Nsụka. Ha nwekwuru kolu na mpaghara akụkụ Obolo.

Otu onye ode akwụkwọ Amerika mgbe ochie dere n’akwụkwọ a kpọrọ “Igbo/Igala Borderland”  na ndị Nsụka bụ ndị ahịa si Arọchukwu. Na njem ahịa ha ka zuru ike na Nsụka ma mesịa birizie ebe ahụ.

Nsukka lụrụ ọtụtụ agha na narị afọ nke iri na asatọ (18th century)  na narị afọ nke iri na iteghete (19th century). Ha meriri n’ọtụtụ agha ha lụsoro ndị obodo agbata obi ha oge ahụ nke mere ụfọdụ n’ime ha jiri rịọ Nsụka ka ha nyere ha aka na-ịchekwaba obodo ha maka mwakpo. Ha weghaara ọtụtụ obodo ndị agbataobi ha meriri n’agha ha bụrụzie mpaghara obodo Nsụka.

 Nrụtụaka; Wikipedia

A gụọla ya ugboro 919

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!