Ahaba(Asaba)

Ahaba bụ ala Igbo Ahaba bụ ala Igbo igbogaadi.org

Ahaba (Asaba)so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Ahaba bụ obodo dị n’elu ugwu nke sọtụrụ isi n’ikpere mmiri osimiri Naịja. O cherịtara Ọnịcha ihu na mpaghara osimiri nke ọzọ. Ahaba nwere onụọgụgụ ihe ruru otu narị puku mmadụ na iri anọ na itoolu na narị isii na atọ (149,603).

Ndị Ahaba, dịka akụkọ siri kọ kwenyere na ọ bụ ezinụlọ agbụrụ atọ dị iche iche mewere Ahaba. Ezinaụlọ agbụrụ atọ a bụ agbụrụ Nnebisi, Ụgbọma na Ezeanyanwụ. E kwuru na Ezeanyanwụ si n'agbụrụ Ezechima. Ezechima n'onwe ya bụ nna nna ọtụtụ obodo dị n'akụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Naịja nakwa gburugburu. Ụfọdụ ndị na-ekwu na Ụgbọma bụ onye izizi bi n’obodo ahụ nke mechara ghọrọ Ahaba. Mana akụkọ isimbido Ahaba taata na-agakịrị ebe nwa amaala Ahaba bụ Nnebisi nọ.

Ọnye bụ Nnebisi? Nnebisi bụ nwa Diaba. Ọtụtụ ndị mmadụ kwere na ọ bụ ya bụ onye izizi bi n’Ahaba. Aha onye na-achọje ya, nne bụ isi. Nne Nnebisi bụ onye Agbakụba dị na Nteje. Nteje dị n’ofe osimiri Naịja ebe ndị Igbo bi n'elu ala bi. Akụkọ kọrọ na mgbe a mụchara Nnebisi na nne ya kpọ ya laghachi be ha na Nteje. Mgbe Nnebisi na-etolite ọ chọpụta na a naghị akpaso ya agwa otu e si akpaso ndị ọzọ. Ọ chọpụtakwara na o nwere ihe ụfọdụ anaghị ekwe ya mee. Mgbe ọ jụrụ ese ka a gwara ya na Nteje bụ ikwu nne ya na ọ bụghị be nna ya. Mgbe ọ nụrụ nke a o kpebie na ya ga-apụ njem ịchọta ala nna ya. Nnebisi buuru nwa warawara ugbo mapụ njem ịchọ ala nna ya. O bu ite ọgwụ otu dibia nyere ya na Nteje bụ ọtụmọkpọ kwesịrị ichekwa ya ma mekwaa ka ọ ruo ala nna ya na-enweghị nsogbu ọ bụla n’ụzọ. Ọ gwara Nnebisi buru ya bụ ite ọgwụ n’isi ka ọ na-aga ya bụ njem. Ite ọgwụ ahụ danahịrị Nnebisi mgbe o ruru ebe ahụ bụ ala nna ya. Ebe ya bụ ite ọgwụ danahịrị ya ma kụrie bụ ebe a na-akpọ ‘Cable Point’ taata nke dị n’ikpere mmiri osimiri Naịja. Ebe ahụ bụ n’ihu nnukwu okwute Onishe bụ ụlọ arụsị mmụọ mmiri a ma dịka Onishe Ahaba. Ahaba bụ mkpu mberede na ahịrịokwu Igbo,  ‘Ahaba m!’ nke pụtara ‘Ahọrọla m nke ezigbo’ n‘Igbo izugbe. Na ya bụ mkpu mberede o tiri, Ahaba m ka Ahaba siri nweta aha ya. E mechara a gbanwe Ahaba kpọwa ya Asaba oge ndị ọbịarachịwa bịara ala Igbo.

Nnebisi lụrụ nwunye abụọ. Nwunye ya nke mbụ Ujom mụụrụ ya ụmụ atọ ndị bụ,: Onne (nwoke) Ezeụmụnne (nwoke) na Ojife (nwanyị). Nwunye ya nke abụọ mụtara nwa nwoke aha ya bụ Iyagba.
Ezeanyanwụ, Ụgbọma, ỌdỊkpe na Obodo Achala so na agbụrụ ndị mbụ bi n'Ahaba. Ise ndị nke ọzọ bụ ụmụ ụmụ nnebisi - Ezenei, Ugbomanta, Agụ, Ajajị na Ọnaje.

Ahaba nweburu ebo iteghete nke mere o jiri bụrụ Ahaba ebo ite'nani. Ụmụ ụmụ Nnebisi mmadụ ise mechara mụbawanye ụba ma loo ọtụtụ agbụrụ ndị mbụ bi na Ahaba. Ha ise bụzi ndị mebere ebo ise dị n’ Ahaba taata.

Onye na-achị Ahaba bụ eze ọdịnala nwere ezigbo ugwu. A ma ya ama dịka Asagba Ahaba. Ebo ise Ahaba nwere Diọkpa dịka onye isi na-elekọta ma na-anọchitate anya ebo ha n'obi Asagba. Ahaba na ndị Igbo agbataobi  ha dịka Ọgwashị Ukwu, Igbuzọ, Ọkpanam na Oko na-enwe ezigbo mmekọ ka ha bụ otu.
Ọ bụ osimiri Naịja kewara ala Igbo ụzọ abụọ. Ya bụ osimiri kamgbe gboo mekwara ka mmekọrịta ndị Igbo ofe mmiri na ndị Igbo elu ala dị ezigbo mfe ma na-emekwa ka ịdị n’otu ha dịka ụmụnne sie ike. Osimiri Naịja nyere aka na-ịkwalite azụmahịa n’etiti ala Igbo na ndị ụwa ndị ọzọ.

 Nrụtụaka; Wikipedia

A gụọla ya ugboro 712

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!