Ebumnuche Igbogaadị bụ dịka aha ya siri dị, ka Igbo ghara ịda mmiri ma dịkwara anyị ọkpụtọrọkpụ. Ọ bụ maka iso kwalite ụtọasụsụ ọma na omenala Igbo ka m jiri hiwe Igbogaadi n'ihi na onye arachaghị ọnụ ụgụrụ enyere ya aka. Igbogaadị bụ ebe anyị ga na-atụgharị uche n'ụdị dị iche iche site na-ịkọ akụkọ onwe anyị. Site na-ịji aka anyị kọ akụkọ onwe anyị ka anyị ga-eji nye aka iso gbanwe ọtụtụ akụkọ gbasara anyị ma sikwa ebe ahụ na-akwalite ụtọasụsụ Igbo dịka asụsụ ụwa ndị ọzọ. Ọ na-abụ chi na-efo, ọkụkọ a na-enwe dị, anyị agaghị atọ òtú ébē ébé asụsụ ndị ọzọ na-efezi èfé. Asụsụ Igbo Kwesịrị iso asụsụ ndị mba ọzọ na-eto, sorokwa na-amụta ụmụ dịka asụsụ ụwa. Igbogaadị ga na-ebipụta ihe gbasara Igbo n'ụdị dị iche iche dịka akụkọ onwe anyị nke ga-abụ onye gụcha o nwe ike ịmụta ilu, akpalaokwu, akụkọ ifo wdg.

Ḿbọ̀ kachasị ḿbọ̀ anyị na-agba bụ ịhụ na anyị ejighị olundị (olumba) wee na-edepụta ihe niile dị ihuakwụkwọ Igbogaadọ, ya mere anyị ji agbalị òtù anyị nwere ike wee were Igbo Izugbe na-atapịa ihe niile edere ebe a. Mana ọ ga-abụ ihe obi ụtọ ma ịrụtụrụ anyị aka ebe ọ bụla ị chọrọ ka anyị nwe mgbanye ma ọ bụ ebe i chere na anyị edetaghị ya. Anyị gbadoro ụkwụ na 'Sụwakwa Igbo' maka na ọ ga-abụ ihe ziri ezi ka ọ bụ ma onye Igbo ọ bụla na-asụ Igbo dịka o siri masị ya (olundị) ma were ótù olu na-ede ya ede (Igbo-Izugbe) maka na ótù ike bụ ike niile Ọ bụrụ na anyị akpọghị Igbo mkpa, soro márá na Igbo bụ asụsụ anyị, ma jikọọ aka ọnụ wee kwalite ya, kedụ ka ala Igbo ga-esi bụ otu?

Igbogaadị ga na-egosịpụta ebumnuche ndị Igbo niile uche ha dị na-iso hazie ma kwadokwa asụsụ Igbo. Zitere anyị ihe ị chọrọ ka ka ndị Igbo gụọ, anyị ga-ebipụtakwa ya n'ihuakwụkwọ Igbogaadị! 

Ọzọkwa bụ na Igbogaadị ji maka mmasị ya n'ụtasụsụ Igbo mezuo ezigbo ebumnuche ya wee mebere ndị Igbo n'afọ 2011 ngwa-nro (softwware) e ji akụpụta mkpụrụedemede Igbo na kọmputa aha ya bụ VIRTUAL IGBO. Igbogaadị hụrụ ya na onye na-ede Igbo ma o tinyeghị ndaume mfe dịka ị, ọ, ụ, ụdaelu (Ó), ụdaala (Ò) maọbụ ụdansụda (Ō) na ya ka o wee nwe ezigbo nkọwa, na onye ahụ ebidobeghị ide asụsụ Igbo maka na a nyụcha nsị ma a kapịbaghị ya ọnụ, ọ bụrụ otoro. VIRTUAL IGBO mere ka ịkụpụta mkpụrụedemede Igbo na kọmputa dị oke m̀fé ma dịkwa ụtọ. Ị ga-ejikwa ya kụpụta mkprụedemede ñ, ya na ₦.
Ọ bụ eziokwu na ndị Igbo anaghị akpọ ihe mkpa, ya mere na ḿbọ̀ niile m gbara ka Igbo mara maka ya enweghị isi. Agbakwara m nnukwu ḿbọ̀ ka ụmụ akwụkwọ anyị na-agụ Igbo n'ụlọ akwụkwọ nweta ya wee hụ ihe ha ga-eji na-akụpụta mkpụrụedemede Igbo ebe o zuru oke na kọmputa n'ihi na onye ziri nwata jide nkapị ga-edebere ya mmiri ọ ga-eji kwọ aka. Anyị agaghị agwa ha gụwa Igbo ma anyị agaghị enye aka ime ka ọ dịrị ha mfe.  Ḿbọ̀ m niile bụ n'efu, enweteghị m enyemaka kwesịrị ka m nweta maka ya bụ VIRTUAL IGBO! Mana anyị agaghị ada mba maka na onye kpọọ ite ya mkpọkọrọ ite ndị iro ewere ya kpoo ntụ ụtụtụ

Biko soro Igbogaadị kwalite ụtọasụsụ Igbo n'ihi na bekee abụghị nke anyị, ka anyị cheta na onye nñụñụ ọgọdọ anaghị agbasi egwu íké.
Nke anyị bụ nke anyị, nke m bụ nke m.

Ana m ekwu na agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị - Mazị Emeka E. Agbaka