Ichu uchu ndị Igbo

Ọba ji Ọba ji

"Ngana kpuchie ute, agụụ ekpughe ya - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Tupu ndị nna nna anyị ha atụọ ilu dị otu a, ha chọpụtara na-ịgba ḿbọ̀ ịkpata ihe ụmụ ha ga-eri dị óké mkpa. N’ime ụfọdụ obodo dị n’ụwa bụ ụmụnwanyị na-akpata ihe ezinaụlọ ha na-eri, ma ndị Igbo hụrụ ya dị ka ihe dịịrị nwoke ịzụ ndị be ya nri. Ụmụnwanyị ndị Igbo abụkwaghị sọnsọ oriakụ ka ha bụ, ha na-esokwa enye aka akpata ihe ezinaụlọ ha ga-eri, na-enyere di ha aka ịhụ n’ihe na-aga sịrịrị werere dịka idozi akụ.

Ndị Igbo bụ ndị a maara dị ka ndị na-echu uchu nke úkwú ma na-agbakwa ḿbọ̀ nke ọma, ma nwoke ma nwanyị dị na ha. Site na-igba ḿbọ̀ ndị Igbo ka ha siri nwee ọnọdụ kara àkà na mba Afrịka niile dị ka ndị e jiri ịzụ ahịa wee mara. Taata ndị Igbo abụkwaghị sọnsọ ahịa ka ha na-azụ, ha na-agụ akwụkwọ nke ọma na-arụkwa ọrụ bekee na mba ụwa dị iche iche ma jidekwa ụdịrị ọkwa na akara mmụta dị iche iche. N’ihi igba óké ḿbọ̀ ndị Igbo ka ha jiri nọdụ n’akụkụ ụwa niile na-achọ ihe áfọ́ ga-eri. E ji ndị Igbo amaatụ na obodo ọ bụla ị batara ma ị hụghị onye Igbo na ya, gị kwara ibu gị pụọ maka na ebe ahụ abụghị ebe obibi.

Ndị Igbo bụ ndị dị ezigbo nkà, ihe ọ bụla ha lere anya, ha ga-emeputa ya kpomkwem dịka nke ezigbo, mere ndị mba ọzọ ji akpọ ụfọdụ ọrụ adịgboroja ‘Igbo-medi’. Oge ndị Igbo nụrụ agha, ha ji aka ha wee mepụta ọtụtụ ngwa agha dị iche iche na-egbughị oge ọ bụla dịka ogbunigwe ma ọ bụ ojukwu bọket ma jirikwa áká ha na-akpụ egbe na-atụpụ. Nkà na ịgba ḿbọ̀ bụ ihe Chukwu jiri gozi ndị Igbo nke nyeere ha ezigbo aka n’oge agha.

Ndị Igbo bụ ndị nwere ihere ka ha bụ, ọ kachasị banyere anaghị agba ḿbọ̀ n’ihi na onye ngana enweghị ùgwù n’ala Igbo. Nwoke anaghị apụta n’ụtụtụ gbatịpụ ọkpa na-achọghị ihe afọ ga-eri maka na Igbo kwere na ọ bụ áká ájā ájā na-eweta ọnụ mmanụ mmanụ. Agbụrụ ọ bụla na-echu echu nke úkwú na-enwerịrị aha ọjọọ site na ntaji anya agbụrụ ndị ọzọ na-atajiri ha. Nke ndị Igbo agaghị adị iche maka na ha bụ ndị Igbo na-aga n’ihu ma na-achọkwa ka ha buru ụzọ n’ihe ọ bụla ha na-eme. Ụfọdụ na-amazi atụ, ha asị na ndị Igbo bụ ọ chaa sị gbute, ma ọ chaghị sị gbute, ma chezọkwaa na ihe dị be òké dịkwa be ọgịnị.

Anyị bụ ndị Igbo ga na-agba ḿbọ̀ na-aga n’ihu maka na ọchụ nwa ọkụkọ nwe ádá ma nwa ọkụkọ nwere mwemwe ọsọ, mana ka anyị wepụkwanụ áká enwe n’ofe, ka mkpọrọmọnụ a na-akpọ ndị Igbo wee belata.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 817

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!