Ala Igbo

Ụmụ nwanyị Igbo Ụmụ nwanyị Igbo Onyonyo si na nairaland.com

"Mmiri nwere awọ, nwee mbara, enwezuola ndị na-ekwere ya égwú - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ebe ọ bụla sọrọ ka ndị Igbo si bịa, ha eruola ala Chineke kwere ha na nkwa, nke juputere na mmiri ara ehi na mmanụ-añụ. Ndị Igbo, ọ kwa ebe onye bi ka ọ na-awachi? Nke a wee bụrụ ụka, bụrụ ilu. Ala Igbo bidoro na mgbadaugwu etiti ọdịdaanyanwụ wee ruo na mgbadaugwu ọwụwaanyanwụ mbà naịjiria. Ndị Igbo karịrị mmadụ nde iri anọ n’ọnụ ọgụgụ, ma ndị nọ n’ụlọ, ma ndị nọ n’ụzọ ije.

Nkụ dị na ḿbà na-eghere ḿbà nri, n’ihi na ọ dị be ndị ga-adịrị ha ma nke anyị dịkwara anyị. Aha e jiri mara agbụrụ anyị bụ̀ Igbo, asụsụ e jikwara mara anyị bụrụ Igbo. Ụfọdụ ndị ọkammụta sị na ị za “Ibo” karịa Igbo ka ha mma, mana ndị Igbo n’ekwu na uche onye anaghị adị ya njọ. Agbụrụ anyị bụ Igbo amaka ḿmā mana ọ fọdụrụ ótù ihe iji chọọ ya bụ ugo mma, n’ihi na ọ bụ ugo tozuo, ọ chakee. Asụsụ Igbo dị ezigbo mkpa ime ka ọ bụrụ asụsụ ga-akwụdosi ike, ma bụrụkwa asụsụ-izugbe onye Igbo ọ bụla.

O nwere ótù ajụjụ dị oke mkpa onye Igbo ọ bụla kwesịrị ị tule gbasara nwatakịrị nrịanrịa bụ naịjiria. Naịjiria nwéré ọtụtụ nwaneku nwa, nke ndị Igbo so n’otu n’ime ha. Chetakwa na nwa anwụla, nwa anwụla, mana ọ bụrụ na nwa kachie ntị nwụọ, nwaneku nwa alawa. Ọ bụrụ na nwatakịrị nrịanrịa ahụ bụ naịjiria dọbiri echi nwụọ, ọ dáá egwu onye lawa, onye lawa, kedụ asụsụ anyị bụ ndị Igbo ga-eji chị onwe anyị? Gịnị ga-abụ asụsụ-izugbe, asụsụ-nkwekọ na asụsụ-ọchịchị ALA IGBO? Ụfọdụ ga-asị na ọ bụ bekee kara dịrị anyị mfe ịsụ asụ na ide ede ma karakwa nwee ugwu karịa asụsụ Igbo. Ụfọdụ ajụọ sị ma e ji Igbo eje ebee. Ụmụnne m, anyị agaghịkwa ekworo maka na agụ na-emeri enwe, sị na ụdara nwa enwe ga-abụzi ụdara nwa agụ. Bekee bụ asụsụ ndị ọzọ ka ọ bụ ma bụrụkwa asụsụ nñụta. O nweghị ihe ọjọọ dị na-ịmụta, ya na ịsụ bekee dịka agbụrụ ndị ọzọ, n’ihi na ọ bụ asụsụ-ozurumba mana anyị ga-echeta na ọ̀kwà gwara ụmụ ya, ha tụrụ ji, ha tụrụ mkpọrọgwụ maka ụbọchị onye nwe ji ga-egwuru ji ya ka ha tụrụwa mkpọrọgwụ.

Ọtụtụ ḿbà dị iche iche ndị bekee chịrị mgbe tere aka dịka naịjiria nke asụsụ-ọchịchị ha bụ bekee, amarala uru asụsụ-onwe bara wee were ya na-agbanwe bekee dịka asụsụ-izugbe ha, ịmaatụ, ḿbà dị iche iche n’akụkụ ọwụwaanyanwụ afrịka ewerela sụwahiri taata merekwa asụsụ-izugbe ha. Ihe na-ebute iji bekee mere asụsụ-ọchịchị ma ọ bụ asụsụ-nkwekọ bụ ma agbụrụ dị iche iche bikọọ ọnụ dịka ọ dị na ḿbà naịjiria, mana ala Igbo bụ naanị ndị Igbo bi na ya ma e wepụ nwaobere ikwunaibe ndị binyeere anyị. Ezigbo onye Igbo ọ bụla ma na Igbo amaka ḿmā, maka na ọ bụ mmiri ya bụ ugo jiri kwụọ aka ka ụgbala jiri ghụ ahụ chakee.

Onye na-echeta nwata nrịanrịa ahụ bụ naịjiria, ya biko na-echetakwa asụsụ Igbo, maka na a naghị anọ n’ihu ọgụ apị akụ. Ndị Igbo, agha a kara aka anaghị eri ngwọrọ, ka anyị gharakwanụ iti na anyị anụghị ka e gburu kpom, wee nụ ka ọ dara yọm. Anyị ga-ewere olu Igbo bido imekọ ihe ọnụ, ka ntụ́ na aghụghọ wee belata maka na ntụ́ n’aka ḿmā na bekee (oyibo).

Akwụkwọ Malakaị 2:10; “Ọ̣ bụghị otu nna ka anyị nile nwere? Ọ bụghị otu Chineke kere anyị? Gịnị mere anyị ji aghọ ibe anyị aghụghọ, na-emerụ ọgbụgba ndụ ndị nna nna anyị?”

Mmiri nwere awọ, nwee mbara, enwezuola ndị na-ekwere ya égwú. Ndị Igbo jikọọ aka ọnụ, égwú ha ga na-ada ụda, dakarịkwaa ikoro.
Soro na-eti na Igbo ga-adị!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 652

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!