F. C. Ọgbalụ

Dọkịta Frederick Chidozie Ogbalụ Dọkịta Frederick Chidozie Ogbalụ igbogaadi.org

Onye kọrọ akụkọ Igbo ma ya akpọnyeghị Ọgbalụ dị ka onye kọrọ akụkọ ifo chezọọ mbe na agụ. Ihe e jiri mara Dọkịta Frederick Chidozie Ogbalụ bụ nna asụsụ na omenala Igbo. A mụrụ ya n’Adagbe Abagana n’afọ 1927. Ọ lụrụ ọrụ dịka onye nkuzi na ndụ ya niile ma burukwa ụzọ n’ihe gbasara nkwalite ọdịnala Igbo. Ọ kuziri asụsụ Latin, asụsụ Igbo nakwa ọdịdị ala (geography) n'ọtụtụ ụlọ akwụkwọ. Mmasi ya n'ihe metụtara asụsụ Igbo malitere oge e nwere mgbagha gbasara otu a ga-esi na-ede na etu a ga-esi na-akpọpụta mkpụrụokwu Igbo nakwa otu a ga-esi melite usoro ọnụọgụgụ Igbo ka ọ dị mma ka asụsụ ndị ọzọ.

Dọkịta Ogbalu bipụtara edemede n’akwụkwọ akụkọ “Nigerian Spokesman” n'afọ 1948 kwụtọ ọchịchị ndị ọbịarachịwa  maka agbaghị mbọ iso kwado nhazi asụsụ Igbo. Mgbe ahụ ọ na-akụzi nkuzi na DMGS Ọnịcha. Na ederede ahụ ka ọ nọrọ gbagha usoro ọhụrụ mkprụrụedmede Adams maọbụ ọtọrọfị Adams (Adams-Ward orthography) nke ụfọdụ ndị ọkammụta asụsụ Igbo na-akwado. Ọgbalụ kpọrọ ọtọrọfị Adams ahụ ihe mkparị n'ihi na akara ụda olu dị n’ime ya karịrị akarị nke ga-eme ka usoro ịmụ asụsụ Igbo sie ike ma nwekwuo mgbagwoju anya. Onye isi ụlọ akwụkwọ ya oge ahụ na DMGS dụrụ ya ọdụ na ọ ga-akara ya mma ide na ibipụta akwụkwọ akụkọ nke ya n'asụsụ Igbo kama ị na-ezigara ndị akwụkwọ akụkọ ederede ya. Ọ nabatakwara atụmatụ ahụ wee guzobe òtù Iwelite Asụsụ na Omenala Igbo (Society for Promoting Igbo Language and Culture) n’afọ 1949. Ọgbalụ dị afọ iri abụọ na abụọ wee mepee ulọ ọrụ mbipụta akwụkwọ aha ya bụ Varsity Press n’Onịcha.

Ndị òtù Iwelite Asụsụ na Omenala Igbo (SPILC) nwere ọtụtụ ọmarịcha ebumnuche dịka ịkwalite ọmụmụ na mmụta asụsụ Igbo, ikwado ikwu okwu n’ihu ọha, nzukọ na ihe nkuzi,  ịgba ndị na-eto eto na-ede akwụkwọ Igbo ume yana inye aka mee ka ndị Igbo ghara ileghara ọdịnala Igbo anya. Ọ bụ ndị Òtù Iwelite Asụsụ na Omenala Igbo (SPILC) nke onye isi ha mgbe ahụ bụ Mazị Ọnwụ jikọtara áká ọnụ wee wepụta mkpụrụedemede ọgbara ọhụrụ a n'afọ 1962. Site oge ahụ ka nkuzi ọgbara ọhụrụ  a na-akpọ ọtọrọfịị Ọnwụ ma ọ bụ mkpụrụedemede Ọnwụ bidoro. Ọ bụkwanụ ndị òtù a mere na ndọrọndọrọ ahụ dịbu n'etiti ndị ụka Fada na Siemesi gbasara ụdịrị mkpụrụedemede e ji ede Igbo jiri kwụsị. Mgbe ahụ ásá na àjà bụ ázụ̀, ndị ụka Siemesi ji olu Owere ede, ebe ndị ụka Fada ji olu Ọnịcha ede Igbo nke ha. Taata, ihe dị iche adịla, ndị Igbo ewerela otu olu na-ede Igbo maka na ihe ọ bụla e megburu mma, bụ nwamma ka a na-akpọ ya ! Ihe a na-akpọ ya bụ Igbo Izugbe!

Mkpụrụ Ogbalụ kụrụ maka nchekwa asụsụ na ọmụmụ omenaala Igbo, dara n’ala dị mma, Emeka Agbaka soro rite uru na ya.

Dọkịnta Ogbalu bipụtara mgbe ọ dị ndụ ọtụtụ akwụkwọ dị iche iche nke chịkọbara ma chekwaba ederede asụsụ Igbo. E denyere ihe kariri edemede iri ise ya n’ọrụ Afigbo dika Ilu Igbo (The Book of Igbo Proverbs).

“Ozu nọ n’ime ala gwara onye na-afụ ọja na ya nụrụ ihe ọja na-ekwu mana aja ụrọ ekweghị ya bilie”  F.C. Ogbalu dere n’ime akwụkwọ Ilu Igbo ya.

Ka mkpụrụ obi F.C zuru ike n'ime Chineke

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1058

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!