Nkwunye ego n'ụlọ akụ maka mgbanwe ego na-agba ume - CBN

Akwụkwọego naịra Akwụkwọego naịra Onyonyo si na @cenbank

 “Agha a kara aka anaghị eri ngwọrọ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ụlọakụ etiti nke Naijiria bụ CBN n'aha ịchafụ kwuru taa bụ ụka na ọ na-agba ume ịhụ otu ndị mmadụ si akwụnye ndekwuru nde ego n'ụlọ akụ n'ihi nkwupụta gọọmentị etiti kwupụtara maka mgbanwe ego. Nkwupụta nke a kọwara na gọọmenti ka kwụsiri ike na-iwepụta akwụkwọ ego ọhụrụ naira n'abalị iri na ise n’ọnwa Disemba (Dec 15).

N’akwụkwọ nkwupụta sitere n'aka ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ ahụ bụ Mazị Osita Nwanịsobi, kọwara na ya bụ atụmatụ ga-aga n'ihu iji hụ na mmejupụta usoro mgbanwe ego naịra enweghị nsogbu ọ bụla. O kwukwara na usoro a bụ iji chekwaba ùgwù naịra site n'ibelata ùkwù ego nke na-adịghị n’ụlọakụ. E hiwere usoro ahụ iji gbochie ịchịgharị ego adịgboroja na iji ego me mpụ nakwa iji gba ndị mmadụ ume itinye ego ha n’ụlọakụ.

Nwanịsobi kọwara na ụlọakụ ha ga na-aga n'ihu ma na-enyonye anya ka ihe si aga. O kwekwara nkwa na ha ga na-eme ka ọhaneze mara otu okwe siri gba mgbe ọ bụla ọ dị mkpa.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 609
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!