Ada anyị eturula ugo dịka Brigadier General n'US Army

“Aka a na-ana dike bụ itunye ya ugbene ugo – Okwu ndị mbụ na ndị egede!
E buliela otu ada anyị nwanyị bụ Amanda Azụbụike n’ọkwa Brigadier General nke ndị agha Amerika bụ United States Army.
Nke a kpọtụrụ n'ogige ndị agha dị na Fort Knox n'ime Kentucky.
Ada rụrụ ọrụ afọ iri na otu n'okpuru ndị ọrụ ngalaba na-ahụ maka ụgbọ elu ma rụkwara ndị agha ọrụ dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhanaeze.
Tupu mbuli elu ya, Amanda na-arụ ọrụ dịka osote onye isi n'US Army Cadet Command.
Lekwa ihe ndị ọzọ ada rụburu, ọ rụrụ ọrụ;
- dịka onye isi ndị ọrụ n'ụlọ ọrụ odeakwụkwọ nchekwa (Chief of Staff at the Office of the Secretary of Defense).
- dịka onye ndụmọdụ ndị agha n'ụlọ ọrụ odeakwụkwọ nchekwa (Military Advisor at the Office of the Secretary of Defense).
- dịka onye isi nke mmekọrịta ọhanaeze na United States Southern Command, mpaghara nke Fort Lauderdale (Chief of Public Affairs).
- dịka onye isi ihe gbasara mmekọrịta ọhanaeze na Joint Force HQs-National Capital Region/Military District of Washington (Director of Public relations Affairs).
- dịka onye ndụmọdụ nkwukọrịta maka otu ndị egwuregwu bọọlụ bụ National Football League Players Association (Communications Consultant).
- dịka onye ọrụ mmekọrịta ọhanaeze maka aha NFL ne ndị Washington Redskins (Public Relations Staff for the NFL Franchise).
Ọ bụghị naanị nzere ndị agha ka ada nwere, Gen. Azubuike nwere nzere bachelọ nke sayensị site na Mahadum Central Arkansas (Bachelor of Science degree in Mass Communication/Media Studies).
O nwere masta ats maka nchebe mba na ọmụmụ atụmatụ site na Mahadum ndị agha (Master of Arts in National Security and Strategic Studies from the United States Army War College).
O nwekwara masta n’ọmụmụ ihe ọkachamara, mmekọrịta ọha na nkwukọrịta ụlọ ọrụ site na Mahadum Georgetown (Master of Professional Studies, Public Relations/Corporate Communications from Georgetown University)
Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!