Igbo na égwú

ekwendigbo.com ekwendigbo.com Egwu Mkpọkịtị

Ndị Igbo na-anụ ihe ọjà na-egbu!
Ndị Igbo na-anụ ihe ekwe na-akụ!
Ndị Igbo na-anụ ihe ogene na-aha!
Ndị Igbo na-anụ ihe ịgba na-ada!
Égwú ndị Igbo asọghị okenye!
Égwú ndị Igbo asọghị nwata!
Égwú ndị Igbo asọghị nwoke!
Égwú ndị Igbo asọghị nwanyị!
Égwú ndị Igbo amaghị dọkịta!
Égwú ndị Igbo amaghị ọkammụta!
Égwú ndị Igbo amaghị ọgaranya!
Égwú ndị Igbo amaghị ogbenye!
Égwú ndị Igbo bụ onye gbata ya gbara!
Égwú ndị Igbo bụ úkwù ruo gị ala!
Égwú ndị Igbo bụ sawankwe!
Égwú ndị Igbo bụ ọyọrịma!
Égwú ndị Igbo bụ yọnyọrịkọ!
Égwú ndị Igbo na-atọ ka nkwụ elu Udi a kụghị mmiri!
Égwú ndị Igbo na-atọ ka ngwọ Ọsụ a kụghị mmiri!
Égwú ndị Igbo na-eme m Igbo amaka Igbo amaka!
Égwú ndị Igbo na...

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!
©️Mazị Emeka Agbaka 2019

A gụọla ya ugboro 1044

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!