Agụleri

Agụlụeri bụ ala Igbo Agụlụeri bụ ala Igbo igbogaadi.org

Agụleri so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Ihe Agụleri pụtara bụ Agụlụ nwa Eri, aha nna na nwa. Ọ bụ obodo dị ebe mmiri Ezu na Ọmambala jekọtara ọnụ (Agbanabọ Ezu na Ọmambala). Agụleri na Nsugbe, Ụmụleri, Anam, Nteje na Nando nwere ókèala na ọdịda anyanwụ, n’ọwụwa anyanwụ bụrụ ndị Anakụ, Ọmọọ, Ifite Ọgwarị, Ịgbakwụ na Ụmụeje, na ndịda bụrụ Ịggaa, Ọjjọọ, Asaba na Ogwurugwu nke Ụzọ Ụwanị Ịga na steeti Enugwu ebe ha na Obele, Odeke, Eshonwa ndị nke dị n’Ịbaji Ịga na steeti Kogi nwere ókèala na mgbago ugwu.

Dị ka akụkọ ntọala siri kọ, a na-ekwu na ọ bụ otu nwoke a na-akpọ Eri bụ nna nna Agụleri nakwa nke agbụrụ Igbo. Mgbe Eri bịara n’ikpere mmiri ebe mmiri Ezu na Ọmambala jekọtara ọnụ (Agbanabọ Ezu na Ọmambala), o ji okwute garara ọnụ wuo ụlọ nchụ aja ebe ahụ. Eri mechara kwago n’elu ala n'ihi íjū na-eto kwa afọ n’ikpere mmiri. O wukwara obi ya a na-akpọ Obu Uga ebe ahụ ọ kwagara bụ Agụleri taata.

Eri mụrụ ụmụ ise, Agụlụ, Ata, Ọba, Menri na Adamgbo (Iguedo bụ naanị otu nwanyị Eri mụtara). Ụmụ Eri niile bikọrọ ọnụ n’Aguleri wee ruo mgbe nna ha nwụrụ. Ha gbasasịrị ebe dị iche iche ka Eri nwụchara si otu ahụ guzobe obodo dị iche iche nwere ézè ọdịnala. Ata (Attah) nwa Eri nke abụọ pụrụ ga guzobe ala-eze n'Ịgala. Attah na Ịgala ka bụkwa ézè ọdịnala ha ma taata. Ọba nwa eri nke atọ kwagara ọdịda anyanwụ ebe o hiwere alaeze Bini. Menri hapụkwara Agụleri ma guzobe alaeze Nri. Agụlụ bụ diọkpara Eri nọọọrọ n'obi nna ya dịka omenala Igbo siri dị ma kpara ala nna ya na ihe onwunwe ndị ọzọ.

Agụlụ nwa Eri (Agụleri) lụrụ ụmụ nwanyị atọ ndị nke bụ Ada, Ọmalị na Eke. Ụmụ nwanyị atọ a mụụrụ ya ụmụ nwoke anọ ndị aha ha bụ Ivite, Igboezunu, Enugwu na Eziagụlụ. E kwuru na Ada nwunye Agụlụ nke mbụ atụghị ime n'oge, Agụleri (Agụlụ nwa Eri) wee lụọ Ọmalị dị ka nwunye nke abụọ. Ọmalị tụrụ ime mụtara ya diọkpara aha ya bụ Ivite. Chukwu mekwara gọzie Ada nwunye ya nke mbụ o wee tụrụ ime mụtara ya nwa nwoke nke abụọ a kpọrọ Igboezunu. Agụlụ nwa Eri lụrụ nwunye nke atọ aha ya bụ Eke. Chineke gọziri Eke ọ mụtara Agụleri (Agụlụ nwa Eri) ụmụ nwoke abụọ aha ha bụ Enugwu na Eziagụlụ. Ndị nwunye Agụleri (Agụlụ nwa Eri) atọ ahụ bụ ndị mebere Akwụnatọ.

E kewara Agụleri n’ogbe atọ, Igboezunu, Ivite nakwa Enugwu na Eziagụlụ (Ugwu na adegbe). Ụfọdụ n’ime ezinaụlọ ndị a bi n'Agụleri ụnọ ma birikwa n’ Agụleri otu.
I ke akụ na ụba nakwa ala obi n’omenala Igbo gbakwasara ụkwụ n’usoro ọmụmụ. Diọkpara na-ebu ụzọ ewere oke ma ọ bụrụ na-ekebe ihe nna. Nke a mere ogbe ndị bi n'Agụleri jiri bụrụ Igboezunu-otu, Ivite-otu, Eziagụlụ-otu na Enugu-otu. Ha bụ ndị bi n’ikpere mmiri ma ọ bụ Aguleri-otu bi na mgbada Omambala.
E nwekwara ndị mbịarambịara ọhụrụ akpọrọ Ndị-Ụka (Mbito). Ha bụ ndị si Egbeagụ dị n’ime Eziagụlụ Agụleri. Ebe a bụ ebe ndị ụka Katọlik mbụ bịara siri bido ịgbasa oziọma tupu ha gawa obodo ndị ọzọ. Ọ bụ Amaeze (Otuocha) bụ taata obodo mepere emepe e jiri mara Agụleri.

Agụleri bụ obodo nwere ezi agụgụala ochie. Agụleri nwegasịrị ọtụtụ ebe ọdịbendị nke e jiri ihe ncheta ọdịnala mara mma dozisi. Ọdịbendị ụfọdụ bụ Agbanabọ Ezu na Ọmambala, Ajana Ukwu, Ugwu Ogodo, mmiri Ovilivo nakwa ọtụtụ ebe akụkọ ihe mere eme ndị ọzọ n’Agụleri.
Agụleri na-eme emume dị iche-iche mana ndị puru iche n’ime ha bụ Alọmmụọ (mmemme iri ji ọhụrụ ma ọ bụ Ivejioku) na Ịgba Ada nke ogbe Agụleri nille na-eme.
Mmemme Ovalla bụ emume ọzọ na-adọta ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa ekpori ndụ n'ụdị iche iche n'Agụleri. Ndị Agụleri na-akwanyere mmemme a  ugwu pụrụ iche.
Olili Ọbịbịa Eri bụkwa otu nnukwu emume Agụleri na-eme n’ọnwa nke asaa kwa afọ. Ọ bụ emume a na-emere Eri bụ nna nna Agụleri nakwa agbụrụ Igbo.
Mmemme ndị ọzọ Agụleri na-eme bụ Ụta Ọba, nke ọ bụ naanị ndị chizuru echizu na-eme, Akwalị, Ọlụta bụ mmemme a na-emena njedebe oge íjū na-eto nakwa Nzideana nke a na-eme iji malite ọrụ ugbo.

Ọnụọgụgụ ndị bi n’ Agụleri mara ihe na narị puku mmadụ itoolu (900,000).

Nrụtụaka; Wikipedia

 

A gụọla ya ugboro 852

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!