Ị bụ ọkammụta ebe m bụ ọzụahịa... mmeri gị ga-aka nke m – Peter Obi

Ị bụ ọkammụta ebe m bụ ọzụahịa... mmeri gị ga-aka nke m – Peter Obi

“Onye riri nwanne ya nakpu ụra bu ọnụ nakpu – Okwu  ndị mbụ na ndị egede!

Mazị Peter Obi bụ onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke Labour Party (LP), azaghachila nkatọ nke ọkammụta Chukwuma Soludo bụ gọvanọ Anambara steeti katọrọ ọnya ego ọ gbara.

Na mkparịtaụka Soludo na ndị igwe onyonyo Chanels TV nwere n’oge adịghị anya, ka ọ nọrọ kwu na ọ́nyà ego mazị Peter Obi jiri ego Anambara steeti gba oge ọ bụ gọvanọ aghọrọla ihe efu ugbu a. Ọ gakwara n'ihu kwuo na Obi enweghị usoro kara aka nke ga-enyere ya aka iji meri dịka onyeisiala n'okpuru ndọrọndọrọ ọchịchị nke Labour Party.

Ụbọchị Tuzdee gara aga ka Peter Obi zaghachiri azụ, kwuo na ya na Soludo dị ezigbo mma, na ya na-etinyekwa ya n’ekpere mgbe ọ bụla. O kwuru na Chineke enyela Soludo ohere imezi nke ọma ihe ndị nke ya emetaghị. Ọ kọwara na ọchịchị anaghị agwụ agwụ, na onye chịcha rituo onye ọzọ esi ebe ọ kwụsịrị gawakwa n'ihu.  O kwukwara na ọkammụta Soludo nwere ikike ugbu a ịrụrụ ndị Anambra ezigbo ọrụ karịa ka ya siri rụ dịka onyedu nọ n'oche ọchịchị.

Peter Obi ji International Breweries ma atụ iji gosị na ọ́nyà ego ọ gbara oge ọ bụ gọvanọ alaghị n’iyi. O kwuru na International Breweries so na òtù ụlọ ọrụ Ab Inbev, nke bụ ebe a na-esi mmanya biya bukarịchara ibu n'ụwa niile.

N’okwu ya, steeti Anambara nwere atụmatụ na ụlọ ọrụ mba ofesi ọ bụla chọrọ ịgba ọ́nyà ego n’Anambara, ga-eresị steeti pasentị iri nke ụlọ ọrụ ha. Atụmatụ a bụ oge ọ bụ onyendu na steeti ahụ ka e hiwere ya. Nkwekọrịta ọzọ bụrụkwa na ụlọ ọrụ ahụ ga-ewe ndị Anambara n’ọrụ, opekatampe ya bụrụ pasenti iri anọ. Ọ kọwara na ụlọ ọrụ ha wuru na steeti Anambara mgbe ahụ na-ewe ihe karịrị puku mmadụ iri ndị Anambra n’ọrụ taa ma bụrụkwa otu n’ime ebe ego gbara ọkpụrụkpụ si abata n’akpa steeti.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 767
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!