Naịjirịa ebughachila Mazị Nnamdị Kanụ azụ

Mazị Nnamdị Kanụ Mazị Nnamdị Kanụ Onyoonyoo si na fij.ng

"Dike na-azọ ala, ala a na-azọ dike - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Mịnịsta n’ahụ maka ikpe ma bụrụkwa Ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami kwuru na mkparịta ụka ya na ndị nta akụkọ ụbọchị Tuuzdee na e jidere onye ndu IPOB bụ Mazị Nnamdị Kanụ ma bughachitekwa ya azụ na Naijiria ka ọ bịa zara ọnụ ya n’ụlọ ikpe.

E kwuru na Mazị Nnamdị Kanụ hapụrụ Naịjirịa n'afọ puku abụọ na iri na ise (2015) nke mere na ọ bịabeghị ụlọ ikpe zara ọnụ ya kamgbe ahụ nke o jikwanụ nwe onye ma ebe ọ nọ tupu ejide ya. Ha ekweghị ekwu ebe ha nọrọ  jide ya.

Malami kwuru na ebughachiri Mazị Kanụ azụ na Naịjirịa ka ọ zara ọnụ ya n'ihu ụlọ ikpe gbasara ebubo iri na otu a na-ebo ya. E jidere Kanụ na n’ablị iri abụọ na asaa bụ ụka n’ọnwa Juun n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (27.06.2021).

E jideburu Kanụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Ọktoba n'afọ puku abụọ na iri na ise (14.10.2015) maka ebubo iri na otu nke e boro ya, nke ụfọdụ n'ime ha bụ maka iyi ọha egwu, maka nnupu isi megide obodo, maka njikwa otu nke iwu akwadoghị, maka mbipụta okwu mkparị, maka ịnwe egbe nke iwu akwadoghị na maka ibubata ngwa ahịa na-ezighi ezi.

E boro ya ebubo na ọ na-akpa agwa na-emebi ihe dị ka isi na telivishọn, ụlọ ọrụ redio na mgbasa ozi ịntanetị akwalite ọgbaghara megide gọọmenti Naịjirịa.

Malami kwukwara na a na-ebokwu Kanu ebubo na ọ na-ebute ọgbaghara, ọkachasị na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ọgbaghara nke buterela ọnwụ ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị agha na ndị uwe ojii ma na-akwado mbibi ụlọ ọrụ obodo nakwa ihe ndị gọọmenti.

Onụ na-ekwuchitere Ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Umar Gwandu gwara CNN na a kpụgara Mazị Nnamdị Kanụ n'ụlọ ikpe taata. Ọ bụ n’ụlọ ikpe nke abụọ bụ ụlọikpe ukwu nke etiti dị n'Abụja. O kwuru na-aga-ebughachite ya azụ na ya bụ ụlọ ikpe n’abalị iri abụọ na asaa n’ọnwa na-abịa abịa bụ ọnwa Julaị.

Nrụtụaka; CNN

A gụọla ya ugboro 563
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!