Soludo emeriela dịka onye ga-azọrọ APGA ọkwa gọvanọ .

"Aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmannụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!
Na ntụliaka mbụ nke ndị APGA mere n'abali Wenezde ka ọkammụta Soludo meriri dịka onye ga-azọchitere ndị APGA ọkwa gọvanọ na ntụliaka nabịa abịa maka nhọpụta gọvanọ n'Anambara. E mere ntụliaka nke a n'ụlọ ọgbakọ Professor Dora Akunyili Development Center nke dị n’Ọka. Ọkammụta Soludo nwere ihe ruru ntụliaka narị asaa na iri anọ (740 votes) nke nyere ya iji meri ndị ọzọ maka na aka karịrị pasenti iri itolu (90%) dịka ọ dị n’usoro APGA.
N'okwu nnabata ya, Chukwuma Soludo kwuru na ya ji obi umeala wee nabata nhọpụta a họpụtara ya dịka onye ga-azọchitere APGA ọkwa gọvanọ na ntụliaka gọvanọ nke na-abịa ọnwa Nọvemba. O kelekwara Chineke maka ime ka ya bụrụ onye Anambara.
O kwere nkwa na ya ga-ewepụta oge ezigbo wee jere ndị Anambara ozi site n'ịrụsi ọrụ ike ebe ọ ga-apụ iche ịhụ na ya ga-ahapụ ezi mkpụrụ ma ya pụwa karịa nka ya zutere.
Ntuliaka ahụ gara n'ihu n'agbanyeghị nnukwu arụmụka gbasara ebubo nke ndị otu Jude Okeke boro ndị otu Victor Oye na ha enyefeghị kọmitii ndị ọgbakọ pụrụ iche bụ Special Ward Congress akwụkwọ ikike nke abalị iri abụọ na otu nke a kpọrọ statutory 21 days notice. Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi ndị otu Jude Okeke bụ Ikechukwu Chukwunyere boro ebubo ahụ ụbọchị Mọnde n'Abuja mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu maka ihe na-eme n'ime pati APGA.
Chukwunyere kwuru na ndị otu Oye agwaghị INEC n’oge atụmatụ ha na ha ga-enwe ọgbakọ tupu ntụliaka mbụ gọvanọ n'ime abalị iri abụọ na otu dịka iwu siri kwado ya na ngalaba nke iri asatọ na ise nke iwu ntụliaka.
A ga-eme ntụliaka ọkwa gọvanọ Anambara n’balị isii nke ọnwa Nọvemba n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (06.11.2021).
Nrụrụtụaka; Chanelstv.com