Anambara ga-ahazi asọmpị ndị ntorobịa FC Bayern nke afọ 2022

Anambara ga-ahazi asọmpị ndị ntorobịa FC Bayern nke afọ 2022

"Nkwụ na nkwụ ga-akwụkọ tupu ha esiwe ogologo - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Akụkọ anyị nwetara site n'akwụkwọ akụkọ Anambra People na-akọwa na ọ bụ ndị Anambara ga-ahazi asọmpị nhọpụta nke mba maka iko ndị ntorobịa nke FC Bayern nke afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ (2022). Ihe a kpọrọ ya bụ asọmpị na bekee bụ FC Bayern Youth Cup Nigeria.

Asọmpi nke a ga-akpọtụ n'ọgbọ egwuregwu ọhụrụ dị n’Awka nke bụ isi obodo Anambara bido n'abalị iri abụọ na itolu ọnwa Eprel ruo n’abalị mbụ nke ọnwa Mee n'afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ (2022). Onye ntụzịaka otu asọmpi iko ndị ntorobịa FC Bayern na Nigeria bụ Victor Obinna Edeh mere ka anyị mata nke a ụnyahụ.

O kwukwara na ndị ahọpụtara n'asọmpị ịkpọ òkù nke afọ a ga-aga Muniki ( Munich) nke dị na mba Jamani (Germany) ịga nọchite anya Naịjirịa na asọmpi mba ụwa. Ha ga-ezutekwa ndị ọzọ si n'akụkụ mba ụwa gbururugburu na Ọktọba.4

Dị ka anyị siri ghọta, FC Bayern Youth Cup bụ usoro asọmpi mba ụwa mepere emepe maka ụmụ nwoke dị afọ iri ise nakwa iri asaa sitere na mba dị iche iche n'ofe ụwa.

Chiifu Tony Oli onye nke bụ onyeisi oche ndị na-ahụ maka uto egwuregwu na steeti Anambra kwuru na atụmatụ i bute asọmpi ikpeazụ nke mba Naijiria na steeti Anambra dabara n'echiche gọọmentị nwere ime Anambra ka ọ bụrụ isi ụlọ ọrụ bọọlụ n’Naijiria.

Ndị egwu boolụ Bayern Munich abụọ ama ama bụ Giovane Elber na Klaus Augenthaler bịara Naịjirịa n'afọ puku abụọ na iri na asatọ (2018) ịhọpụta ndị egwuregwu bọọlụ doro any.  Ha họpụtara ndị ntorobịa anyị dị ka Daniel Francis, Christian Nwachukwu na Stanley Iheanacho ka ha gaa n'ihu ịnọchite anya Naịjirịa n’asọmpi iko Mbaụwa nke ndị erubeghị afọ iri na asaa (U17 FIFA World Cup) nakwa asọmpi WAFU (West African Football Union) nke bụ otu egwuregwu bọọlụ ọdịda anyanwụ Afrịka.

 Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 961
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!