Ikechukwu Umeọnyịrịọha abụrụla onye nkuzi asụsụ Igbo mbụ na Mahadum Oxford

Emmanuel Ikechukwu Umeọnyịrịọha Emmanuel Ikechukwu Umeọnyịrịọha

"Ihe ahụ di wọrọ ogori azụọla n'ahịa - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Otu n'ime mahadum kacha mma n'ụwa bụ mahadum Oxford nke dị n'England ahọrọla Emmanuel Ikechukwu Umeọnyịrịọha dịka onye nkuzi mbụ ga-akụzi asụsụ Igbo na Mahadum Oxford.

Onye bụ nwa okorobịa ọma a? Ikechukwu bụ onye Igbo kpọmkwem ma bụrụkwa ọkaibe n'asụsụ, ode akwụkwọ nakwa onye nduzi ntụgharị asụsụ.

N’ihu akwụkwọ Facebook ya ka o dere na n’ezie na ya abụrụla onye nkuzi asụsụ Igbo mbụ na ọkpọkọpị mahadum Oxford. O dekwara na ọ bụ Marion Sadoux, onye nke bụ onye isi mmemme asụsụ ọgbara ọhụrụ na mahadum Oxford webatara ya na ya bụ ọrụ n’abalị nke iri na asaa n’ọnwa Febụwarị n'afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ (17 February 2022).

O kọwara na ọ bụ nke a bụ izizi a ga-akụzi asụsụ Igbo na mahadum ụwa. Ọ bụ n'ihi ndị otu a kpọrọ ‘James Currey Society’ ka ya bụ atụmatụ jiri nwe isi.

“Nnukwu ihe akụkọ mere.”

N'okwu ya, o dere "Obi dị m ụtọ nke ukwu maka ohere nke a, enwekwuru m nnukwu afọ ojuju banyere ya. Ana m ekwe nkwa ịkwalite ma mee ka ụwa mara gbasara asụsụ na omenala Igbo."

Klasị mbụ ga-amalite na Tọzdee (24.02) n'izu na-abịa abịa n’elekere atọ wee ruo elekere anọ nke uhuru chi. na 12 Woodstock Road.

Igbo niile kwụ gị n'azụ, odogwu abụghị naanị mgbe a kwaturu mmadụ!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 920
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!