Ndị e chere na ha bụ ndị na-achị ehi wakporo ma gbuo nwanyị na Nimbo

Ndị obu egba achị ehi Ndị obu egba achị ehi Onyoonyoo si na Premium Times Nigeria

Ọ bụghị naanị ụdara mụtara nwa a na-apịwa ọnụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Akụkọ anyị gụtara n'ihu akwụkwọ akụkọ Vanguard n’uhuru chi taata kọrọ na ndị e chere na ha bụ ndị obu egbe achị ehi wakporo ma gbuo otu nwanyị aha ya bụ Cordelia Ụtazị n'ugbo ya dị n'Ugwujoro Nimbo ụbọchị Mọnde bụ abalị iri na astọ n'ọnwa ọktoba n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (18.10.2021). Nimbo dị n'okpuru ọchịchị Uzo-Uwani na steeti Enugwu. 

Ha dere na ọ bụ ebe nwanyị ahụ nke e jiri Oyee Eze mara na nwa ya nwanyị bụ Onyinye na-eho ahịhịa n'ugbo ha ka ndị a na-eche na ha bụ ndị na-achị ehi wakporo ha wee berikọọ nwanyị ahụ.

 

Akwụkwọ akụkọ Vanguard gara n'ihu kọọ na Ada ya nwanyị mere ka nne ya ahụ nwụrụ anwụ mara na ndị na-achị ehi na-abịa ịwakpo ha mana mgbe ọ hụrụ na ha na-abịa ngwa ngwa, o riri mbọmbọ ọsọ ka ọ ga kpọọ ndị ime obodo.

Otu nwoke soro buga ozu nwanyị ahụ nwụrụ anwụ n’ụlọọgwụ Faith Foundation dị na Nsukka metropolis gwara Vanguard na ọ bụ ebe nwanyị ahụ na Ada ya na-eho ahịhịa n’ugbo ka Ada ya nwanyị leliri anya elu wee hụ ndị na-achị ehi na ehi ha n’ime ugbo ha. Ọ kpọtụrụ nne ya tupu ọ gbapụ ọsọ gbagawa ime obodo ịkpọ ndị mmadụ. Mgbe Onyinye kpọrọ ndị ime obodo, ha gbagaruo ebe ahụ ihe mere hụ ebe  nwanyị ahụ dile n'ime ọdọ ọbara ya. Mana tupu ha erute ebe ahụ, ndị na-achị ehi ekporola ehi ha ga zokpuo n'ime ọhịa dị nso.

   

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na ọ bụ ihe mere eme. Ọ kọwara na ha ebidola nyocha iji nweta ndị omekome ahụ a na-ebo ebubo na ha gburu ya bụ nwanyị n'Ugwujoro Nimbo. O kwere nkwa na ha ga-eme ka ọhaneze mara ihe ha nyochatara.

Onye isi oche otu Miyetti Allah Cattle Breeders Association South East (MACBAN) bụ Gidado Siddiki gụpụrụ ndị otu ya na mwakpo ahụ. Ọ kwụ kwụsie ike na o nweghị ndị otu ha na-achị ehi gara mpaghara ọchịchị Uzo-Uwani nke steeti Enugwu n’ụbọchị ahụ.

O kwuru hoo haa na ọ bụghị onye ọ bụla na-achị ehi a hụrụ n'ime ọhịa bụ onye otu MACBAN.

Nrụtụaka - Vanguard Nigeria

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

   

A gụọla ya ugboro 656
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!