Ncheta olundị n'ụwa niile

Asụsụ olundị Asụsụ olundị igbogaadi.com

"Ihe onye bara nkịta ya ka ọ ga-aza - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Taata bụ ụbọchị ndị òtù UNESCO wepụtara maka icheta asụsụ na ọdịnaala n'ụwa gbaa gburugburu nke ha kpọrọ ncheta olundị n'ụwa niile. Dịka e siri nwe ọtụtụ mba na obodo dị iche iche ka e sikwara nwe ụdịrị asụsụ na ọdịnaala dị iche iche.  Mmemme nke a bụ maka ime ka asụsụ agbụrụ ọ bụla dị ndụ, ya na ikwalite odịnaala agbụrụ niile. Ncheta olundị n'ụwa niile na-adị kwa afọ ọ bụla ụbọchị iri abụọ na ótù n'ọnwa febụwarị (21 February). Ọ bụ kamgbe afọ puku abụọ (2000) ka e wubere emume a ka a na-echeta ya kwa afọ niile.

Igbogaadị ghọtara na ihe e jiri dewe ya bụ ụbọchị maka ncheta olundị bụ n'ihi na ọ bụ ụbọchị ndị uwe ojii gbagburu ụmụakwụkwọ abụọ na dhaka, n'afọ iri na itolu, iri ise na abụọ (1952). Ụmụakwụkwọ ahụ na-eme ngagharị iwe ka gọọmenti họrọ asụsụ ha bụ bengali dịka asụsụ-ala nke abụọ n'ala ha bụ pakịstan mgbe ahụ. [International Mother Language Day has been observed every year since 2000 February to promote linguistic and cultural diversity and multilingualism. The date represents the day in 1952 when students demonstrating for recognition of their language, Bengeli, as one of the two national languages of the then Pakistan, were shot and killed by police in Dhaka,which is the capital of present day Bangladesh.] Kaosiladị, taa ha bụzi ndị bangladesh ma werekwa bengali dịka asụsụ-ala bangladesh.

Ndị Igbo, ihe onye bara nkịta ya ọ ga-aza. A na-ekwu na asụsụ Igbo na-achọ ịda mmiri ọ na-efe anyị efe na ntị. Ka anyị buru n'obi na onye asụsụ ya fulahịrị, na omenala ya efukwuola maka na a naghị aghara isi ga gwụọrọ otele ájụ́. Anyị bụ Igbo hapụ ihe e jiri mara anyị, maranụ na ọdịnaala ndị Igbo efoula. A naghị agwa nwata maara ihe ya pụta n'anwụ maka na ọ bụ a na-ekiri ugo, a na-ekirikwa osisi obeere na ya. Agbụrụ anyị bụ Igbo zuru ime ka asụsụ anyị kwụrụ chịmchịm maka na miri nwere awọ nwee mbara e nwezuola ihe na ekwere ya egwu. Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 766

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!