Akpa amamihe

Akpa Amamihe Akpa Amamihe igbogaadi.com

"Ahịa mbe abụọ zụrụ uru anaghị adị ya - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Amamihe bụ ezigbo ihe ka ọ bụ na ndụ mmadụ niile nọ n’ụwa. Ọ bụ agụgụ isi, akọnauche, na nghọta. Ezi amamihe bụ amamihe ziri ezi na anya mmadụ na Chineke. Akwụkwọ Ilu, 3:19; “Chineke ji amamihe tọọ ntọala ụwa. O jikwa nghọta mee ka eluigwe guzosie ike.” Uche bụ akpa, onye ọ bụla nya nke ya, ya mere na ihe m na-akọrọ gị ebe a ji bụrụ nghọta na uche obi nke m. Cheta na uche onye anaghị adị ya njọ mere na onye kwuchaa okwu n’ihu ọha o kwuo kama a ga-etufu ya sị tufuo okwu ya. Nke a gosịrị na amamihe anaghị ezu oke maka na obodo tere aka, ọzọ dị ya n’azụ.

Ọkammụta na ọkaramara n’akwụkwọ abụghị ya bụ amamihe maka na oke ogologo abụghị ya bụ na nwa m etoola. Amamihe, dị́kà agụgụ isi, akọnuche na nghọta, dịkwuazị iche na aghụghọ. Ọ dị oke mkpa mmadụ ịghọta ihe dị iche na amamihe na aghụghọ. Akwụkwọ Ilu, 9:10; Ịtụ egwu Chineke bụ mmalite amamihe, ịmara Onye kasị nsọ ka nghọta bụkwa.”

Ihe ọzọ jọrọ njọ bụkwa “óké” amamihe. Óké amamihe bụ mmadụ ịmapu akpa amamihe ya ma chee na o juru n’ọnụ karịa nke ndị ọzọ. Gerekene atụ a nna m maara m. E bunyere otu nwoke akpa gwa ya gaa n’ukwu osisi a na-akpọ osisi amamihe ka o were mkpụrụ-amamihe tụtụjuo akpa ahụ. Ka nwoke ahụ ruru n’ukwu osisi amamihe ahụ, mkpụrụ-amamihe daranụ wee ju ebe niile ma bụrụkwa sọ mma, nke bụ na ọ maghị ebe ọ ga-ebido tụtụwa. Ka nwoke a tụtụjuru akpa ya, kama ọ ga-ahapụ ndị fọdụrụnụ lawa, o were anya ukwu chọọ ka ya fọnyekwuo mkpụrụ olemaole n’akpa. Otu ihe ọ maghị bụ na oge ọ na-agba ḿbọ̀ iji íké fọnyekwuo mkpụrụ amamihe olemaole, na akpa ya si n’ike wee dọpuo. Nwoke a nọọrọ n’ukwu osisi amamihe na-atụtụ mkpụrụ-amamihe alaghị ala n’ihi na akpa ya ekweghịkwa eju eju. Ka ọ na-afọnye, ka ọ na-adasịsị, nke kachasị nke bụ na ihe na-adapụ adapụ ka nke ọ na-etinye etinye. Ndị ọzọ soro bịa ịtụtụ mkpụrụ-amamihe weere nyayọ na-eso ya n’azụ, ha tụtụọ ka ha ga-atụtụ, ha eburu nke ha tụtụtara lawa maka na akọ bụ isi ije. N’ikpeazụ, nwoke ahụ gba aka lawa n’ihi na mkpụrụ-amamihe dị n’akpa ya dafuchara ebe ọ na-agba mbọ ka nke ya ka nke mmadụ niile. Ndị ahụ maara mgbe akpa ha jiri ju mechakwara kara nwoke anya ukwu ahụ nwee mkpụrụ-amamihe. Mana ihe kachasị mkpa ịmụta bụ na nwoke ahụ amaghị na mkpụrụ-amamihe dị n’akpa ya fọdụrụ naanị ntakịrị. O ruo ebe a na-atụ aro, ọ sị na a ga-ewere nke ya maka na akpa amamihe ya jukarịrị nke onye ọ bụla. Nna m wee gwa m na uche na-abịa abịa na o bighị n’ime mmadụ. Akwụkwọ Abụ ọma, 37:30-31; “Ọ bụ ọnụ onye ezi omume na-ekwupụta amamihe n’olu dị ala, Ọ bụkwa ire ya na-ekwu ihe ziri ezi. Iwu Chineke ya dị n’obi ya; Ụkwụ agaghị ama ya jijiji”

Óké amamihe na aghụghọ bụ ótù ihe ji ndị Igbo n’ala wee ruo taata. Ala onye ọ bụla ma óké ihe enweghị onye ma ihe na ya maka na ahịa mbe abụọ zụrụ, uru anaghị adị ya. Ótù enyi m nwoke gwara m na ọ na-adị mma onye mee ka ọma ihe, o mee ka ọ maghị maka na egwu nkịta na ibe ya bụ onye daara ibe ya. Ka ndị Igbo were obi nwanne na-eme ihe niile ha na-eme. Onye chee maka onwe ya, ya chekwaa maka ụmụ anyị ndị amụbeghị amụ. Anyị gbàà uru, anyị agbàà ọghọm.

Akwụkwọ Jeremaya 9:23; “Nke a bụ ihe Chineke kwuru: ‘Ka onye maara ihe ghara iji amamihe ya na-anya isi, ka dike ghara iji ike ya na-anya isi. Ka ọgaranya ghara iji akụnụba ya na-anya isi.”

Ka amamihe anyị na-abawanye ụba n’ụdị ga-abara Igbo niile uru! 

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 417

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!