Ndị Igbo zuru ka e mee

Ikpirikpi ọgụ Ikpirikpi ọgụ Onyonyo si na legit.ng

"Ọhịa nwere ebu, nwee mfụ, enwezuola ihe na-agba agba - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ndị Igbo zuru ka e mee n’ụdị ọ bụla e siri chọ ya. Ọ bụrụ na a gụwa agbụrụ bụ ọkpọka n’Afrịka ma agụnyeghị Igbo, mara na ọ bụ onye iro gụrụ ya. Igbo kwụ dịka ide ji ụlọ n’ụdị ọ bụla e siri chọ ya, ma n’ịba ụbara mmadụ (nke anyị kachasị), ma ndị ọkammụta na ọkaramara, ma ndị dị nka, ma ndị ji akụ, ọ bụ ole ka anyị ga-agụ ghara ibe ya. O nweghị ihe a na-achọ achọ n’ala Igbo maka na ọhịa nwere ebu, nwee mfụ, enwezuola ihe na-agba agba. Ndị Igbo zuru ka e mee.
Ka anyị were oge anyị bụ ndị Igbo nụrụ agha maa atụ, ndị Igbo jiri otu ntabianya kwado ihe niile obodo na-enwe dịka soja, uweojii, ọdụụgbọelu, ụlọakụ na ego nke ha, wdg. Ndị Igbo gosịpụtara ụdịri agbụrụ ha bụ site n’imepụta ụdị ngwa agha dị iche iche na nwa obere oge ha nwere, nke tụrụ ụwa niile egwu. Mberede nyịrị dike mana ọ bụ mberede ka e ji ama dike.
Dịka o siri dị taata na mba naịjiria, o nweghị ihe a ga-emebe leghara ndị Igbo anya maka na uru e si n’aka ha erite bara ụba. Ndị Igbo ji aka ha, jide ala Igbo niile na-emepe ya ka ọ bụrụ sọ ḿmā, site na-ịrụ ụzọ ha si ala be ha, ịgbapuru onwe ha mmiri wee ruo na-itinye ọkụ eletrik n’akụkụ ala Igbo niile. Ụdịrị ihe ndị a bụ ihe ndị Igbo na-agbakọ aka ọnụ mechapụ eleghị anya n’azụ.
Naanị ihe fọdụụrụ ndị Igbo iji bụrụkwa akwaakwụrụ bụ udo na ịdịnotu dịka ọ dị na mbụ tupu anyị nụọ agha. Ọ bụrụ na ndị Igbo chịkọlata onwe ha ọnụ bụrụ otu, o nweghị agbụrụ nọ n’Afrịka egwu ga-ekwe tụọ ha aka n’ihu maka na ọkụkọ tụsuru ọnụ erugheru, ya n’ihe ga-eme. Ndị Igbo kwesịrị ịmụta ikwosa agbụrụ ndị ọzọ ekworo hapụ ikwosa onwe ha, jikọọ aka ọnụ maka na nna anyị ha gwara anyị na ọ bụ a nyụkọọ amịrị ọnụ ọ gbụọ ụfụfụ.
Ndị Igbo ga-ahapụ ị na-ekewasị onwe ha na steeti dị iche iche (Abia, Anambra, Delta, Ebonyi, Enugu, Imo, Rivers, wdg.) mara n’ala Igbo enweghị oke maka na ECS mechara ghọrọ steeti abụọ (Anambra na Imo), taata ọ dịzi steeti ise, onye máárá steeti ole ọ ga-adị echi. Anyị agaghịkwa agụpụ ụmụnne anyị ndị bi na steeti ndị agbataobi anyị kwuo na ha abụzighị ndị Igbo n’ihi na bekee bịara. Sị kwụsị oke nkewasị ebe onye si maka na ọ na-abụ e gbuo dike n’ọgụ ụlọ, ọgụ pụọ ama, a chọwa dike.

Arịrịọ m bụrụ ka Igbo jikọọ aka ọnụ n’ihi na ọ bụ e were aka nye aka o too ogologo, onye Igbo ọ bụla baara ala Igbo uru. Anyị nọrọ na-adụ onwe anyị aka n’ọnụ, màránụ na o nweghị ebe anyị ga-eru, ihe niile Igbo nwere ga-abụ ihe efu. Anyị agaghị ekwe ka nke a mee ma anyị na-echeta mgbe ọ bụla na ọ bụ NDỊIGBO zuru ka e mee maka na otu osisi anaghị emebe ọhịa.
Ihe ị ga-ajụ onwe gị taata bụ ihe ị naghị emeta ma ọ bụ ihe ị ga-eso me ka ala Igbo wee bụrụkwa akwaakwụrụ dịka ọ bụ mgbeochie. Igwe bu ike!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 450

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!