First Bank na-akwalite isi mba ofesi ezilata ego n'ala anyị bụ Naịjiri

Ọkọlọtọ First Bank Ọkọlọtọ First Bank igbogaadị.com

"Onye sụrụ ọhịa ga-ata ọka - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ụlọ akụ First Bank of Nigeria Limited ekwuola na ha na-eji Naịra ise (₦5) ana ndị ahịa ha aka maka dollar ọ bụla ha nwetara site na mba ofesi.

Ha bidoro atụmatụa  na Mọnde bụ abalị asatọ n'ọnwa Maachị (March 8)  ma ga-akwụsịkwa ya ụbọchị Satọde ga-abụ abalị asatọ n'ọnwa Mee (May 8). Ha na-akwụ ndị ahịa FirstBank Naịra ise (₦5) maka dollar ọ bụla batara n'akaụntụ ha n'agbanyeghị ma ha achọrọ ịnara dollar n'ogbe n'ime ụlọ akụ ma ọ bụ kwunye ya n'ime akaụntụ ha. Ụlọ akụ First Bank nwere ngalaba karịrị narị asaa na iri ise (750) na Naịjiria.

Ndị ahịa ụlọ akụ First Bank irite erere a bụ site n'atụmatụ ndị ụlọ akụ etiti bụ Central Bank wepụtara nke ha kpọrọ "Naira 4 Dollar" maka ịkwalite isi mba ofesi ezilata ego n'ala anyị bụ Naịjiria. 

Iji maa atụ bụ na onye ahịa ọ bụla kwụnyere ma ọ bụ a kwunyere ego ruru puku dolla iri (10,000 USD)  ga-erite erere puku naịra iri ise (N50,000.00) dị ka ụgwọ ọrụ.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-agadị!

A gụọla ya ugboro 1028
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!