Ndị otu ahịa IPMA adọla ndị Naịjirịa aka na ntị na mmanụ ụgbọala ga-etinye ego

Igwe na-agbaputa mmanụ ụgbọala Igwe na-agbaputa mmanụ ụgbọala Onyonyo si na bbc.com/pidgin

"A na-ekwu  na ọrịa ezughị oke a sị onye dara ibi ya tokwzuo afọ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ndị otu na-anọchite anya ndị ahịa mmanụ ụgbọala na Naịjirịaa bụ ndị a kpọrọ Independent Petroleum Marketers Association of Nigeria ( IPMAN) atụnyela ndị Naijiria azụ ka ha tụọ anya mbugo ego mmanụ ụgbọala n’ ụbọchị na-abịa abịa ma kwuo na ọnụahịa otu lita nwere ike ịrịru otu narị naịra na iri itoolu na ise (₦195).

Ha gbarụrụ ihu kọwa na gọọmenti etiti, NNPC nakwa PPMC anaghị akwụ n’okwu ha nakwa ihe gbasara iwu.

NNPC kwere nkwa n'izuụka gara aga na ọnụahịa mmanụ ụgbọala agaghị arị elu rue mgbe gọọmentị etiti na ndị ọrụ ga-enwe nzukọ na njedebe ọnwa Febụwarị.

Onye isi njikwa otu ngalaba ihe gbasara ọhaneze bụ GPAD n’aha mkprisi nke NNPC bụ Dọkịnta Kennie Obateru kwuru na NNPC ebulibeghị ọnụahịa ego mmanụ ụgbọala nke ha ji enwe atụmatụ ibuli ya na Febụwarị n’afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021).

Ndị otu IPMAN kwukwara na n’agbanyeghị nkwa nnweta ngwa ahịa nke NNPC na-ekwe, na ha enweghị ike inweta ya n’ọdụ mmanụ NNPC. Nke a mere ha ji agbakwu ndị nwere ọdụ mmanụ onwe ha maka ngwa ahịa.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1001
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!