Gọọmenti Enugwu steeti ekwela nkwa na ha ga-akọta nri ga-ezu ọha ọnụ oge adịghị anya.

Ihe oriri Ihe oriri Onyonyo si na guardian.ng

"Ori mgbe e nyere ya anaghị eri mgbe ọ gụrụ ya - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Otu jikọtara ndị na-azụ ahịa ihe oriri na ndị na-ere ehi bụ ndị nke si mgbago ugwu a na-akpọ Amalgamated Union of Foodstuffs and Cattle Dealers kwụsịrị ibudatara ndị ọdịda ọwụwa anyanwụ ngwa nri kamgbe Tọzdee bụ ụbọchị iri abụọ na ise n’ọnwa Febụwarị.

Ha kwuru na ihe kpaliri ibido mgbochi ibudata ngwa nri bụ maka na gọọmentị etiti emeghị ihe ha chọrọ, dịka ịkwụ ha nde narị naịra anọ na iri asaa na ise (N475m) maka ihe ndị mmadụ mebiri n'oge ngagharị iwe #EndSARS nakwa oge nsogbu nke ọnwa gara aga na Shasha dị na steeti Oyo.

Imirikiti imi gọọmentị ndịda ọwụwa anyanwụ na ndị ọrụ ugbo ekwuole na mgbochi nke ndị ahịa nri si mpaghara ugwu gbochiri ibudata nri bụ ohere ndị ndịda ọwụwa anyanwụ iji chu uchu ịkọpụta ihe ubi ebe ọ ga-ehi nne.

Ụbọchị mbụ n’ọnwa Machị bụ Mọnde ka Steeti ndị dị na ndịda dị ka Lagos, Cross River, Akwa Ibom, Delta, Enugu na Ondo nọrọ kwu na ha agaghị anwa anwa rịọ ndị ahịa nri si ugwu biko ka ha kwụsị mgbochi ibudata ngwa nri na ndịda Naịjirịa.

Gọọmenti Enugwu steeti nọrọ kwe nkwa na ha ga-akọta nri ga-ezu ọha ọnụ oge adịghị anya. Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Chidi Aroh kwuru na gọọmenti Enugwu nwere ọtụtụ atụmatụ na-agba ụmụ amaala ume ịbanye n'ọrụ ugbo.

O kwuru na gọọmentị Enugwu anaghị eme anya ụra nke mere ugbo osikapa dị n'Adani ji arụ ọrụ nke ọma ma na ekpopụtakwa osikapa n’uju ya. O kwukwara na ha ji ọtụtụ ọrụ n'aka dị ka ime ka Ose Nsukka (ose odo) bawanye ụba nakwa iso kọsi akpụ ike ka o zuo ọha. N'okwu ya, obi siri ha ike nke ukwu n'ihe gbasara ọrụ ugbo mere ha jiri bido atụmatụ ịzụ ehi Igbo (Efi Igbo) nke abụghị obere ọrụ.

Ndị ọrụ ugbo Enugwu steeti nyere aka kwuo na ha ga-akọpụta nri ebe o hiri nne ma ọ bụrụ na e nweghị ehi ndị Fulani n'ọhịa ha. Ha kwuru na ehi ndị Fulani na-ata ihe ubi ha ma na emebi ihe ha kọrọak ma rịọ ka e nyere ha aka hụ na ọ kwụsịrị

 Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 991
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!