Ụlọ ọrọ ụgbọelu United Nigeria bụkwa nke anyị

Ụgbeelu United Nigeria Ụgbeelu United Nigeria Onyonyo si n'aviationweek.com

"Akpata n'anwụ e rie na ndo - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ụgbọelu ọhụrụ UNITED NIGERIA bụ ụgboelu otu nwafọ Igbo ọzọ aha ya bụ Obiọra Ọkọnkwọ. Ụgbọelu United Nigeria ga na-efe otu ụzọ dịka ụgbọelu Air Peace si efe ma werekwa Akanu Ibiam International Airport Enugu dị ka isi ụlọ ọrụ ha. Chetakwa na Air Peace bụkwa nke nwafọ Igbo aha ya bụ Alem Omyema.

United Nigeria malitere ọrụ azụmahịa ozugbe izu abụọ gachara ha jiri nweta asambodo ife ụgbọelu (AOC n’aha mkprisi) site n’aka ndi oru Nigerian Civil Aviation Authority (NCAA).

Na mmeghe azụmahịa United Nigeria, ha fere ụgbọelu mbụ ha si Legọsị fega Enugwu ụbọchị ọnwa Febrụwarị gbara mkpụrụ abalị iri na abụọ (Febụwarị 12).

Onye isi oche United Nigeria bụ Obiọra Ọkọnkwọ kwuru na ha nwere nnukwu atụmatụ na olileanya na n’oge adịghị anya na ha ga-ebuwanye ma gbasaa gafere Naịjirịa. Ọkọnkwọ kwukwara na ụlọọrụ ụgbọelu ha na-atụ anya ife ọkọlọta ha n'ime ọnwa atọ n’abịa abịa.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 844
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!