WTO ahọpụtala Ngọzị Okonjo-Iweala dịka onye isi nduzi ha

Ngọzi Oknjo-Iweala, Ada Igbo Ngọzi Oknjo-Iweala, Ada Igbo Onynyo si na capitalbancorpgroup.com

"Ejula kpuru isi wọrọ onwe ya nri - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

WTO ahọpụtala ada anyị nwanyị bụ Ngọzị Okonjo-Iweala dịka onyeisi nduzi nnukwu ụlọazụmahịa ahụ bụ World Trade Organisation nke e jiri WTO n’aha mkpirisi mara.

WTO sitere na Twitter ha mee ka ndị ụwa mara maka nhọpụta ha họpụtara Dọkịnta Ngozi Okonjo-Iweala dịka onyeisi nduzi nnukwu ụlọazụmahịa ahụ. Okonjo-Iweala jiri ọkwa minista ugboro abụọ dịka Mịnịsta nke okwu ofesi nakwa Mịnịsta na-ahụ maka ego na akụnaụba.

Ọ ga-amalite ọrụ n'abalị mbụ n’ọnwa Machị (Machị 1) ma rụgide ruo n'abalịị iri atọ na otu n’ọnwa ọgọstụ n'afọ puku abụọ na iri abụọ na ise (2025) oge ọkwa ya ga-agwụ.

Na nkwupụta ha, WTO kwuru na ndị otu kansụl izugbe(General Council ) ha mere ihe akụkọ taa bụ abalị iri na ise n’ọnwa Febụwarị (15 February) mgbe ha ji otu olu kwekọrịta ịhọpụta Ngozi Okonjo-Iweala bụ nwa ada Igbo dị ka onyeisi nduzi nke asaa nke nzukọ ahụ.

Ha kwukwara na Dọkịnta Okonjo-Iweala ga-abụ nwanyị izizi na onye isi oji Afrịka mbụ ga-abụ onye isi nduzi WTO ma o bido ọrụ n’ọnwa mbụ Maachị.

Onyeisi oche ndị otu kansụl izugbe(General Council ) bụ David Walker nke New Zealand nakwa ndị  otu nhazi bụ Amb. Dacio Castillo (Honduras) na Amb. Harald Aspelund (Iceland) bụ ndị duru usoro nchịkọta na nhọhọpụta onyeisi nduzi (DG) ahụ ọnwa itoolu. Ha kwuru na oge a bụ oge ịrịba ama ka ọ bụ na WTO. David Walker kwuru na dịka onye nnọchite anya ndị otu kansụl izugbe (General Council), na ya kelere Dr Ngozi Okonjo-Iweala maka nhọpụta ya dịka onyeisi nduzi WTO ma na-anabata ya na nzukọ kansụl izugbe (General Council).

O kelekwara nnukwu ada Igbo maka onyinye amara nakwa ndidi o nwere n’ọnwa olemaole gara aga oge ha na-atụle onye ọ ga-abụ, ma kwekwa ya nkwa na ndị otu ha niile ga-enye aka ma soro ya rụọ ọrụ nke ọma n'oge ya dịka onyeisi nduzi nnukwu ụlọazụmahịa ahụ bụ World Trade Organisation ma ga-eso ya hazi ọgịnihu nke nzukọ ha.

Okonjo-Iweala kelere ma kwuo na ya nwere afọ ojuju na nsọpụrụ na nhọpụta ndị otu WTO họpụtara ya dịka onyeisi nduzi ha. Ngozị nwekwara olileanya na ya na ndị otu ya ga-arụkọ ọrụ ọnụ nke ọma ka ha wee nwe ike hazie ma mekwaa ka akụ na ụba ụwa kwụrụkwa chịm ka ọ dị tupu ọrịa ọjọọ Covid-19. O kwuru na nzukọ ahụ bụ WTO na-enwe ọtụtụ nsogbu mana ọ bụrụ na ha rụkọ ọrụ ọnụ na ọ ga-eme ka WTO kwụdosikwa ike, kwụrụkwa chịm ma gbanwe nke ọma dị ka ọ dị taa.

Nnukwu ada birikwa, Igbogaadị kwụ gị n’azụ chịmchịm ma na-agọrọ gị ọfọ ọganihu na ogologo ndụ, ya gazie!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 970
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!