Nde naịra abụọ (₦2m) maka nkwado ndị ntorobịa na Stanel Awka

Chukwuemeka Ụkwa Chukwuemeka Ụkwa Onyonyo si na sunnewsonline.com

"Ọha nwezuo akụ, mbuje nri ala - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Onye isi oche Stanel Group bụ Dọkịta Stanley Ụzọchukwu ga-enye ndị ọchụnta ego mmadụ anọ ego ruru nde naịra abụọ maka nkwado ndị ntorobịa nke a kpọrọ Youth Empowerment Master Class n’olu Bekee nke na-aga n'ihu n’ụlọ ọrụ Stanel n'Ọka (Awka). E debere ego enyemeaka ahụ dị nde naịra abụọ (₦2m ) maka mmadụ anọ, nke pụtara na ha ga-erite ọkara nde naịra (N500,000) n'otu n'otu.

Mmemme nke a malitere taata bụ Fraịde, abalị iri na abụọ nke ọnwa Febụwarị (Feb. 12) ma ga-akwụsịkwa ụbọchị ụka bụ abalị iri anọ n’ọnwa Febụwarị ( Sọnde, Feb. 14) .

A gwara  ndị ntorobịa na ọ bụrụ na ha tụlee ihe mere n'ọnwa ole na ole gara aga dịka ngagharị iwe #EndSARS na ha ga-aghọta na oge a bụ oge tara akpụ ka ọ bụ ma chetaara ha na ọ dị mkpa ka ha gbado anya, na-agbasi mbọ ike ma na-arụsi ọrụ ike.

Dọkịta Stanley Ụzọchukwu dụrụ ndị ntorobịa ezigbo ọdụ ka ha ghara ịda mba n’ime mmụọ  ma gwa ha na e nwere ọtụtụ ndị nọ ebe ahụ dị njikere inye aka ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ntorobịa dị njikere ịdị uchu ma rụsie ọrụ ike. O kwuru na atụmatụ a bụ maka ịkparịta ụbụbọ, ịdụ ọdụ na ịzụ ndị ntorobịa.

Stanel Youths Empowerment Master Class’ nke mbụ bụ n’afọ puku abụọ na iri na itolu (2019) ka e mere ya. Mmemme nke chịkọtara ọtụtụ ndị isochei azụmaahịa tinyere ndị isi ụlọ ọrụ dị iche iche bụ ndị bịara inye aka zụọ ma dụọ ndị ntorobịa karịa puku mmadụ ise (5,000) ọdụ.

A na-atụkwa anya ọtụtụ ndị isioche azụmaahịa n’Ọka (Awka) ọzọ maka ịgwa ndị ntorobịa okwu. Ndị ga-ahazi isi okwu bụ ndị dị ka Dr Herbert Wigwe bụ onye isi ụlọ ọrụ Access Bank, Dr Cosmas Maduka bụ onye isioche Coscharis Group, Chief Clen Allen Onyema bụ onye isioche Airpeace nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

 Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị.

A gụọla ya ugboro 910
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!