DJ Switch agbarụọla ihu maka mmachi azụmahịa ego Crypto

Ọbịanuju Catherine Udeh (DJ Switch) Ọbịanuju Catherine Udeh (DJ Switch) Onyonyo si na www.dailypost.ng/

"E jighị nkịta kpuru isi aga nta - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Nwa ada Igbo bụ Ọbịanuju Catherine Udeh bụ onye e ji DJ Switch mara, agbarụọla ihu maka  mmachi ụlọakụ etiti bụ Central Bank machibidoro azụmahịa na mgbanwe ego mkpuchi a maara dị ka cryptocurrency na Naịjirịa.

Ụlọakụ etiti bụ CBN nyere ụlọakụ niile iwu na ngwụcha izuụka ka ha mechie akaụntụ ndị niile na-etinye aka na-azụmahịa ego mkpuchi bụ cryptocurrency. Onye tinyere aka n’akwụkwọ ahụ bụ onye nduzi nlekọta ụlọakụ (Director of Banking Supervision) bụ Bello Hassan. Ụlọakụ etiti bụ ụlọakụ kachasị elu dọrọ aka na ntị na a ga-ada ụlọakụ ọ bụla dara ya bụ iwu ọkpụrụkpụ nha ebe ọ ga-agba ha okpofufu.

Dj Switch zaghachiri ha azụ n’ihuakwụkwọ Twitter ya na ọ bụ ụmụ anụmanụ amaghị ihe ahịa zụrụ na-achị Naịjirịa. Ọ gwara gọọmentị na kama ime ụdịrị iwu ahụ megido ndị aka ha dị ọcha na ọ ga-adị mma ka ha soro nyochaa akaụntụ nke ndị na-awakpo ndị mmadụ (Terrorist).

Ọbịanuju dere n’ihuakwụkwọ Twitter ya na ọ bụrụ na mmachibido iwu nke ụlọakụ etiti bụ CBN machibidoro azụmahịa ego mkpuchi bụ cryptocurrency bụ eziokwu, ị mara na ọ bụ ụmụ anụmanụ dị ka “dinosaurs” na-amaghị ihe ahịa na-azụ, ndị kpuru isi nakwa ndị na-akwado ụbịam na-achị Naịjiria. Na ha kwesịrị inyochaa ma mechie akaụntụ ndị na-akwado ndị na-eyi ọha egwu (Terrorist) na Naịjirịa.

Agbụrụ, asụsụ na omenaala Igbo ga-adị

A gụọla ya ugboro 582
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!