Oriakụ Onyealị-Ikpe bụ onyeisi ọhụrụ  n'ụlọakụ Fidelity, ElombaNews

Oriakụ Nneka Onyealị-Ikpe Oriakụ Nneka Onyealị-Ikpe Onyonyo si na newsliks.com/

 

"E jighị ugegbe elele ihe a gba n'aka - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ụlọakụ Fidelity ahọpụtala Oriakụ Nneka Onyealị-Ikpe dịka onyeisi njikwa ọhụrụ ụlọakụ ha. Ụbọchị Fraịde gara aga ka ha gosịrị ndị nta akụkọ ElombahNews nkwupụta ha maka mibido ọrụ nke onyeisi njikwa ha.

Ha dere na nkwupụta ahụ, na ha ji obi ụtọ eme ka ọhanaeze mata maka nhọpụta Oriakụ Nneka Onyealị-Ikpe dị ka onyeisi njikwa ụlọakụ Fidelity nke malitere n’ọnwa mbụ Jenụwarị n’afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021).

A họpụtara Oriakụ Onyealị-Ikpe ozigbo onye bụbu onyeisi njịkwa ụlọakụ ahụ bụ Maazị Nnamdị Okonkwọ gara ezumike nka. Ha kọwara na Oriakụ Onyealị-Ikpe nọchiri anya Mazị Nnamdị Okonkwọ lara ezumike nka n’isi ngwụcha ọnwa Disemba n’afọ puku abụọ na iri abụọ (2020) dị ka usoro iwu ọchịchị ụlọakụ ha siri dị.

Ha gara n’ihu ịkọwara ọhanaeze na Oriakụ Onyealị-Ikpe bụ nwanyị mbụ rigotere n’ọkwa ahụ kamgbe ụlọakụ Fidelity malitere n’afọ iri na itolu na iri asatọ na asatọ (1988) ma bụrụkwa onyeisi ndị isi nke anọ.

Ha kwukwara na tupu a họpụta ya dịka onyeisi njikwa, na Oriakụ Nneka Onyealị-Ikpe rụrụ ọrụ dịka onyeisi njikwa ụlọakụ ahụ na mpaghara Legọsị na ọdịda anyanwụ ma sorokwa n’ótù ọkpọka so na ndị òtù mgbanwe ụlọakụ ahụ kamgbe afọ ise gara aga.

Dịka ha siri kwupụta, ha nwere olileanya na ọchịchị Oriakụ Onyealị-Ikpe na ndi òtù ọrụ ọhụrụ ya ga-agbadosi anya ike na ntọala ụlọakụ Fidelity ya na ndekọ nke arụmọrụ iji weta uto na ọganihu na ya bụ ụlọakụ.

Nnukwu ada birikwa, Igbogaadị kwụ gị n’azụ chịmchịm ma na-agọrọ gị ọfọ ọganihu na ogologo ndụ, ya gazie!

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

Soro m gụọ! Amụba amụta!!

A gụọla ya ugboro 463
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!