Ụmụahịa

Ụmụahịa bụ ala Igbo Ụmụahịa bụ ala Igbo igbogaadi.org

Ụmụahịa so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Ụmụahịa abụghị obodo ka ọ bụ tupu ndị ọbịarachịwa bịa ala Igbo. N’ime ọtụtụ akụkọ a kọrọ, Ụmụahịa bụ otu n'ime nnukwu ahịa dị n’etiti mpaghara ahụ. Ihe e jiri mara Ụmụahịa na mpaghara ahụ n'oge ochie ahụ bụ Ama Ahịa ruo mgbe ọbịarachịwa rutere mpaghara ahụ n'etiti narị afọ nke iri na iteghet (19th Century). Ndị mmadụ kwenyere  na ọ bụ ha bụ ndị kpọgharịrị ma degharịa ya bụ aha na-amaghị ama bidozie kpọwa ya Ụmụahịa. Ụmụahịa bụ mkpụrụokwu Igbo abụọ e jikọrọ ọnụ ka ọ bụ, ụmụ ahịa.

Ama Ahịa abụghị aha obodo ahụ kama ọ bụ ahịa a na-akpọ Afọ Ibeji dị nso na Olokoro. E mechara ndị ọrụ nchịkwa kwaga Umuahia n’ala Ibeku ka ọ dị mfe ilekọta ya anya nke ọma site na njikọta okporo ụzọ n’ime Ibeku na azụmahịa ndị ọbịarachịwa na mpaghara ahụ. Ebe ọhụrụ a kwagara ghọrọ otu n'ime ọdụ azụmahịa dị mkpa n'okporo ụzọ ụgbọ oloko nke ndị United African Company (UAC) wuru maka ibuga ngwahịa na akụrụngwa si mgbago ugwu ruo n'oké osimiri atlantiki maka iji ụgbọ mmiri bupụ ha ala bekee. A kpọrọ ọdụ azụmahịa ọhụrụ ahụ ọdụ ahịa Ụmụahịa-Ibeku iji gosipụta ebe ahịa ọhụrụ ahụ dị. Ụmụahịa-Ibeku ahụ a kpọrọ ya butere esemokwu n'ihi na obodo ndị agbata obi dịka Ọhụhụ, Ụmụọpara, Afụgiri, Ofeme, wdg, achọghị ya. Ha gbarụrụ ihu kwuo na ha nwere ikike ịnọ n’okpuru nchịkwa Ụmụahịa ma ọ bụghị n’okpuru nchịkwa Ụmụahịa - Ibeku n’ihi na ha niile bụ obodo dị iche iche n’ime Ụmụahịa nke Ibeku sokwuru bụrụ.

E mechara a marazie mpaghara ahụ dị ka Ụmụahịa ma kpọwazie ahịa mbụ ahụ bụ afọ Ibeji Ụmụahịa ochie.

Ndị na-ere ngwahịa dịka ite ụrọ, ihe nka, akwa, ọgwụ ọdịnala, mmanya nkwụ na ngwa ọrụ wdg. si ebe dị anya abịa azụ ahịa na ama ahịa n’ihi na ọ dị obodo ndị ọzọ nso site n’ọtụtụ okporo ụzọ bakwunyere isi n’ama ahịa ahụ.

Obodo ise nọ ka ụmụnne bi n’ime Ụmụahịa. Obodo ise a na-emekọrịta ka otu obodo ma ha nọọrọ onwe ha iche iche. Obodo ndị a bụ Ụmụọpara, Ibeku, Olokoro, Ụbakala na Ọhụhụ. Ọ bụ ndị ọbịarachịwa guzobere Umuahia na mbido narị afọ nke iri abụọ (20th Century).

Ụmụahịa bụ isi obodo nke abụọ Biafra bido n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Septemba n'afọ iri na itolu na iri isii na asaa (1967) mgbe ndị agha Naịjirịa jidere isi obodo mbụ bụ Enugwu. Isi obodo Biafra ikpeazụ tupu e merie Ụmụahịa n'abalị iri abụọ nke ọnwa Disemba n'afọ iri na itolu na iri isii na iteghet (1969) bụ Owerri. 

Ndị bi n'ime Ụmụahịa ruru narị puku mmadụ asaa na iri asaa na anọ (774,000).

Nrụtụaka; Wikipedia

A gụọla ya ugboro 544

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!