Dora Akụnyịlị

Dora Akụnyịlị Dora Akụnyịlị Onyoonyo si na qed.ng/

Ọkammụta Dora Nkemjika Akụnyịlị(Ada Edemobi) bụ nwada Igbo onye a mụrụ n'abalị nke iri na anọ n’ọnwa Julaị n’afọ iri iteghete na iri ise na anọ (Jilaị 14, 1954) na Makọdị nke dị na steeti Benue.

Aha nna Dora bụ Chief Paul Young Edemobi onye kpọlatara ya ala Igbo e wee zụlite ya na Nanka nke dị na steeti Anambara. Dọkịnta J.C Akụnyịlị bụ onye Agụlụ dịkwu na steeti Anambra lụrụ ya. Ha abụọ mụtara ụmụ isii nke otu ada n'ime ha lụrụ onye Amerika a ma ama si n'ezinụlọ Corsby.

Ọ gụrụ akwụkwọ mbụ ya n’ ụlọ akwụkwọ St Patrick’s Primary School nke dị n’Isuofia na steeti Anambra n’afọ 1966 ebe o tutere ugo pụrụ iche nke a na-akpọ “Distinction” oge ahụ.  Ka agha Biafra kwụsịrị, ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị bụ Queen of Rosary Secondary School dị na Nsụka dị na steeti Enugu n’afọ 1973 ebe o tutekwuru ugo mmụta mbụ nke a kpọrọ “Grade I Distinction” oge ahụ.

Gọọmentị steeti Ọwụwa Anyanwụ oge ahụ nyere ya ohere agụmakwụkwọ n’efu n'ihi ugo mmụta pụrụ ich o tutegasịrị. Ọ gara Mahadum nke Nigeria Nsukka (UNN n’aha ịchafụ) ebe ọ nwetara ugo “B.Pharm (Hons)” n’afọ 1978 ma mesie tutekwa ugo Dọkịnta (PhD n’aha ịchafụ) n’afọ 1985. Dora bụ onye dibịa bekee nke a na-akpọ pharmacologist n'asụsụ bekee. E tubere ya uoo ọkammụta(dịka Professor of Pharmacology) n’afọ 2000 n'ihi nnukwu ihe nrite nke “Vice Chancellor’s Postgraduate and Research Leadership prize” o ritere na mahadum dị ka onye nnyocha.

O jeere Naịjiria ozi dịka onye isi nchịkwa nke National Agency for Food and Drugs Administration and Control (bụ NAFDAC n’aha ịchafụ) bido n’afọ 2001 ruo n’afọ 2008 ebe ọ rụrụ ọrụ pụrụ iche dịka nwaada Igbo.O jiri eziokwu na nka buso ndị omekaoma agha wee mee ka ọgwụ adịgboroja kwụsị ịbata Naịjiria ebe ọ dị n’uju. Akụkọ Dora na NAFDAC ka na-akọ wee ruo taata.

Dora rụkwaara Naịjiria ọrụ dị ka Mịnịsta na-ahụ maka Ozi na Nkwukọrịta bido n'afọ 2008 rue n’afọ 2010 ma gụzobe atụmatụ “Re-branding Nigeria Project” oge ahụ.

Dora tutere akara nturu ugo kachasị nke onye ọ bụla bụ onye Naijiria tutelara.

Ọ nwụrụ ka ọ gbara afọ iri ise na iteghete n'ụlọ ọgwụ dị n'India na ọnwa June n'afọ 2014 ka ya na ọrịa cancer akpa nwa gbajuru gba afọ.

Ka mkpụrụ obi Dora zuru ike n'ime Chineke.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1025

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!