Chukwuma Nzọgwụ

Mejọ Chukwuma Kaduna Nzeọgwụ Mejọ Chukwuma Kaduna Nzeọgwụ Onyoonyo si na youutbe

A mụrụ Patrick Chukwuma Nzeọgwụ na Kaduna n’afọ 1937. Nne na nna ya bụ ezigbo ndị ụka Katọlik si Ọkpanam nke dịdebere Asaba. Nzeọgwụ gụrụ akwụkwọ praịmarị ya na Saint Joseph's Catholic Primary School dị na Kaduna ma gụọ sekọndrị n’ụlọ akwụkwọ Saint John's College dị na Kaduna.

Nzeọgwụ si na ngalaba ndị agha Naịjirịa deba aha na ndị agha nche oke ala ọdịda anyanwụ Afrịka nke a kpọrọ, West African Frontier Force. O debara aha dị ka onye ọchịagha n’ọnwa Machị n’afọ 1957 tupu ọ gawa ọzụzụ ọnwa isii na mba Ghana, nke gwụrụ n'ọnwa Ọktoba 1957. Ọ gara akwụkwọ ndị agha n’ofesị, n’ụlọ akwụkwọ Royal Military Academy nke Sandhurst ebe o tutere ugo dịka obere ọchịagha n’afọ 1959. O mechara gaa ọzụzụ onyeisi agha na Hythe ma gakwa ọzụzụ usoro ndị ndu agha na Warminster. Nzeọgwụ bụ okorobịa ọma ma o seghị ụtaba nke o jiri chụgheri ụmụ agbọghọbịa.

Mgbe Nzeọgwụ si ala bekee laghachite Naịjirịa n'ọnwa Mee n’afọ 1960, e zigara ya Enugwu n’otu ndị agha 82 Division ebe Mejọ Agụiyi-Ironsi bụ osote onyeisi n'okpuru nwa bekee. E mechara ziga ya Kaduna n’otu ndị agha 5th Battalion ebe ya na Obasanjo nọrọ bụrụ enyi. Ndị Awụsa ndị otu ya bara ya "Kaduna" n’ihi otu o siri mara ala n’ime Kaduna. E mechara were Nzeọgwụ dị ka ọchịagha nkuzi na ọdụ ọzụzụ ndị agha bụ  Army Training Depot na Zarịa. E mechara ziga ya Legọsị ebe ọ ghọrọ onyeisi ngalaba ọgụgụ isi ndị agha n’isi ụlọ ọrụ ndị agha Naịjirịa.  Ya bụ ọchịagha onye Naịjirịa mbụ nwere ọkwa na FSS.

Ndị FSS (Field Security Section) bụ ngalaba ụlọ ọrụ nchekwa ndị ọrụ ha gụnyere inyocha ndị ọrụ agha naijiria (Nigerian Army), nchekwa akwụkwọ nakwa mgbochi agha nzuzo. Nzeọgwụ bụ ọchịagha onye Naịjirịa mbụ nwere ọkwa na FSS site n’ọnwa Nọvemba 1962 ruo n’afọ 1964. Chukwuma so na onye nnyocha ikpe ebubo mgbaokpuru e boro Awolowo na ndị otu ya. Akụkọ kọrọ na Nzeọgwụ kparịrị ọtụtụ ndị ọrụ ibe ya oge ọ bụ onyeisi ngalaba ọgụgụ isi ndị agha Naịjirịa. A kọkwara na ya na Minista nke steeti n’ahụ maka agha bụ Ibrahim Tako kwatara ya. N'ihi ya, e zigara ya na ụlọ akwụkwọ ọzụzụ ndị agha na Kaduna ebe ọ ghọrọ onye nkuzi ndị agha.

Chukwuma Nzeọgwụ bụ onyendu ndị agha kwaturu usoro ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa n’afọ 1966 mgbe e gburu ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị mmadụ iri na otu na ndị agha abụọ ma tọrọkwa mmadụ atọ ọzọ.

Chukwuma Nzeọgwụ nwụrụ n’abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Julaị n’afọ 1967 (29th July 1967) n'akụkụ Nsukka. Ụfọdụ ndị mmadụ kwuru na ọ bụ ndị agha Naịjirịa gbagburu ya mana nwanne ya nwanyị siri ọnwụ na ọ bụ ya gburu onwe ya ka ndị agha Naịjirịa ghara ịkpara ya aka metọọ ya n’ihu ọha.

Ka mkpụrụ obi Chukwuma zuru ike n’ime Chineka

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị

A gụọla ya ugboro 801

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!