Ọnịcha(Onitsha)

Ọnịch bụ ala Igbo Ọnịch bụ ala Igbo igbogaadi.org

Ọnịcha (Onitsha) so n’otu nnukwu obodo dị  n’ala Igbo!

Ọnịcha bụ obodo dị n’ikpere mmiri nke osimiri Naịja. A na-akpọ ha Ọnịcha mmiri mana ihe e jiri mara ha tupu ha gafeta n’ikpere mmiri bụ Ọnịcha Ado na Iduu. Ọ bụ nnukwu obodo mepere emepe nke e ji ọdụ ụgbọ mmiri mara.

Ihe ruru nde mmadụ asaa na narị puku anọ na iri abụọ na ise (7,425,000) bi n’Ọnịcha.

Ọnịcha bụ isi a hụrụ kwaba okpu maka azụmahịa, ụlọ ọrụ na agụmakwụkwọ na Naịjirịa. Ọ bụ n’ime Ọnịcha ka e nwere ahịa kachasị ahịa niile dị na Afrịka nke e jiri Main Market mara. Ihe mere Ọnịcha jiri were ọnọdụ ịbụ isi ahịa bụ n'ihi na ọ dị n’etiti ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ Naịjirịa ma nọrọ n’etiti ala Igbo ndị bi n’elu ala na na ndị bi na mba mmiri ebe a na-egwupụta mmanụ.
Ọnịcha na-ahụ maka nkesa ngwa ahịa si Legọsị ya na ihe oriri si obodo dị iche iche na mgbago ugwu abata n'akụkụ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa. Ego na-ehugharị na nnukwu obodo a ma mee ka akụ na ụba ala Igbo nọrọ n’egwu.

E nwere akwa mmiri n’Ọnịcha nke gafere osimiri Naịja a maara dịka akwa mmiri Naịja (ma ọ bụ Onitsha Bridge) nke jikọtara ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ Naịjirịa.

Ọnịcha so n’obodo nyere aka na mmepe ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa. Ha bu ejije na ihe nkiri Nollywood n’isi site na-iweta ego nakwa ikesasị ihe nkiri maọbụ ejije Nollywood.

Ndị Ọnịcha na obodo ndị agbata obi ya dịka Obosi na Nkwelle Ezunaka na-enwe esemokwu ugboro ugboro banyere oke ala na mpaghara ebe ha nwere oke. Fegge, Wọlịwọ, Ọdọakpụ, Awada na 3-3 bụ mpaghara Ọnịcha mepere emepe nke Obosi na Nkwelle Ezunanka na-arọ anya na ọ bụ ha nwe ya.

Ọnịcha nọ n’okpuru ọchịchị Obi onye bụ onye ndu ndị Ọnịcha. Ndị ichie na ndị okpu mmee na-enyere Obi aka n'ọchịchị ya. Ndị ichie Ume bụ ndị ichie mbụ n'ime ndị ichie niile. E kere ndị ichie ụzọ isii, ha bụ: Onowu Ịyasele, Ajie Ụkadịugwu, Odu Osodi, Ọnya Ọzọma, Ogene Onira na Owelle Osowa, ebe Onowu Ịyasele bụ onye isi ọdịnala. E nwekwara ndị ichie ndị ọzọ gasị dịka ndị nke nọ n’ọkwa nke abụọ a maara dịka ndị ọkwa nakwa ndị nọ n'ọkwa nke atọ bụ ndị nke a maara dịka ndị ichie Ọkwareze. Ndị ichie bụ ndị ndụmọdụ Obi na mkpebi ọ bụla dị mkpa n’ime obi.
Oge ọ bụla a chọrọ Obi ma ahụghị ya, Onowu Ịyasele ga-ejide ọkwa onye ndu ahụ ganye na-achọta Obi ọhụrụ.
Obi Onitsha na-agba ọfala kwa afọ n’ọnwa Ọktoba nke na-adaba n’emume iri ji ọhụrụ a na-eme n’ọtụtụ ebe n’ala Igbo. Nke a bụ otu ụzọ ndị Ọnịcha si edebe omenala ha ma bụrụkwa mmeme buru ibu nke na-adọta ndị ọbịa si ebe dị iche iche n’obodo ahụ.

 Nrụtụaka: Wikipedia

A gụọla ya ugboro 556

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!