Enugwu

Enugwu bụ ala Igbo Enugwu bụ ala Igbo igbogaadi.org

Enugwu (Enugu) so n’otu nnukwu obodo dị n’ala Igbo!

Aha Enugwu bụ mkpụrụokwu abụọ e jikọtara ọnụ n’asụsụ Igbo pụtara enu ugwu nke na-egosi na obodo ahụ dị n’elu ugwu. Ihe e jiri mara ya na mbụ bụ Enugwu Ngwuo. Enugwu Ngwuo bụ otu n’ime ogbe iri mebere obodo Ngwuo. A na-akpọkarị ha ụmụ Ngwuakọ onye bụ nna nna ma ọ bụ onye mbụ agbụrụ ahụ. Akụkọ kọọrọ na Ngwuakọ debere dike nwa ya nwoke bụ Udeneọgụ n'elu ugwu (Enu-Ugwu) iji chekwaba ogbe ahụ n’aka ndị mwakpo. Ya mere Enugwu jiri bụrụ ama Udeneọgụ. Ngwuo na ogbe Oshie gbara na ndịda, ha na ogbe Ojebeogene gbaa na mgbago ugwu ma ha na Nkanụ gbara na ọwụwa anyanwụ.

Ndị bu ụzọ biri n’Enugwu dịka akụkọ siri kọ bụ obere ogbe si n’Nike nke a na-akpọ Ogui bụ ndị agbataobi Enugwu, ha ka jisiri aha ochie obodo ahụ bụ Ogui ike ma ka na-aza ya taata. Ndị Nike bụ ndị dị ike dịka aha ha siri dị. E kwuru na mgbe a na-atụ mgbere ohu na ndị Nike na ndị Aro na-emekọ nke ọma n’ahịa mgbere ohu na mpaghara Enugwu.

Ndị bi n’Enugwu ruru narị puku mmadụ asaa na iri abụọ na abụọ na narị isii na iri isii na anọ (722,664).
E mechara chọpụta kolu n’Enugwu ma malite gwuwe ya nke wetara mmepe na mpaghara ahụ.

Enugwu bụ isi obodo mpaghara ọwụwa anyanwụ mgbe Nigeria nweere onwe ha n'afọ iri na itolu na iri isii (1960).O ruo oge agha n’ọnwa Mee n'afọ iri na itolu na iri isii na asaa (1967) ọ bụrụ isi obodo mba Biafra. Nke a mere e ji akpọ Enugwu isi obodo ala Igbo. Mgbe ndị agha Naịjirịa nwụchiri Enugu ka e bufere isi obodo Biafra Umuahia.

Nrụtụaka: Wikipedia

A gụọla ya ugboro 437

Gụkwuo Akụkọ ndị ọzọ so:

Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!