Ọkammụta Ejiọfọ akatọọla ajọ ndụmọdụ ọkammụta Sheehan megide IPOB

Ndị otu IPOB na-eme ngagharị iwe Ndị otu IPOB na-eme ngagharị iwe Onyoonyo si na HumAngle

"Onye anọghị ebe e liri ozu na-esi n’ọkpa abọ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Onye isi oche otu World Igbo Congress (WIC) bụ ọkammụta Anthony Ejiọfọ akatọọla ndụmọdụ onye ọkammụta mahadum Baltimọ Amerịka bụ Ivan Sheehan dụrụ gọọmentị Amerịka ka ha gụnye ndị otu IPOB dị ka otu ji ike eyi ọha egwu. Ọkammụta Anthony Ejiofor sitekwara n'otu ihuakwụkwọ akụkọ Washington Times bụ ebe ọkammụta Ivan Sheehan dere nke ya zaghachi ya azụ.

Ọkammụta Ejiofor gbarụrụ ihu n’echiche Sheehan nke o bipụtara na mbipụta akwụkwọ akụkọ Washington Times nke abalị anọ n’ọnwa Ọktoba n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (4, Oct. 2021) nke isi okwu ya na bekee bụ “U.S. Ignores Small African Terrorist Group, IPOB at its peril”. O kwuru na ọ bụ echiche aghụghọ nke nwere ike itinye ndụ ọtụtụ ndị Igbo bi na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa karịrị nde mmadụ iri ise n’egwu.

Ọ katọrọ mbipụta ahụ dị ka ihe mkpasu iwe n'ihi na o nweghị eziokwu ọ bụla dị na ya ga-enyere ndị ụwa aka ịtụle ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa. O kwukwara na ọ dị njọ ịgba gọọmentị Naịjirịa ume ịga n'ihu na-ebuso ndị ndịda Naịjirịa bụ ndị ụka agha gụnyere Biafra.

Ọkammụta Ejiofor gara n’ihu kọwaa na IPOB bụ otu na-agba mgba gbagide ikpe ezighị ezi nakwa mmejọ mmadụ na Naịjirịa. Ha na-akwado ime ntuliaka maka nnwere onwe nakwa ezi ọchịchị ma kwenyekwa na nnwere onwe nke ụmụ amaala ụwa niile dịka akọwara na nkwupụta “United Nations A/61/295 nke 2007”.

Ọ gara n’ihu kọwā na e hiwere ESN iji gbochie ndị Fulani na-achị ehi bụ ndị gọọmentị etiti na-akwado bụkwa ndị guzobere ihe karịrị ogige narị anọ n'ime ọhịa niile dị n’ala Igbo. Nke bụ ebe ha na-esi apụta eyi obodo egwu n'ụzọ dị iche iche jọgburu onwe ya dịka ịdakpọ ụmụ nwanyị, ịtọ mmadụ, ịpụnahị mmadụ ihe n’ike, imebi ihe akụkụ ubi nakwa iberi mmadụ kpam kpam.

Ọkammụta Ejiofor kwuru na ndị nchekwa Naịjirịa tọ̄rọ onye ndu IPOB bụ Mazị Nnamdị Kaụ na Kenya nsonso a n’usoro ezighị ezi. Ọ jụrụ Sheehan ma ọ bụ ndị otu a ka ọ na-akpọ otu ndị ji ike eyi ọha egwu were kwuo na ọ dị mkpa ikwupụta na IPOB na ESN emerubeghị ihe ma ncha megide ụkpụrụ “ three State Department” gbasara  iji ike eyi ọha egwu nke mere a ga-eji debanye aha ha dịka ndị na-eyi ọha egwu na “Global Terrorism Index”.

Nrụtụaka – Washington Times

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo

A gụọla ya ugboro 1238
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!