Mazị Nnamdị Kanụ bụ dike ndị mmadụ na-aghọtahie, Yul Edochie

"Onye bunụ ma ebe ọ na-anyị ya - Okwu ndị mbụ na ndị egede!
Akwụkwọ akụkọ Vanguard dere taata na Yul Edochie bụ onye nke na-eme ihe nkiri na Nollywood kwuru na ndị mmadụ na-aghọtahie Mazị Nnamdi Kanụ bụ onye ndu ndị IPOB (Indigenous People of Biafra).
Edochie kwuru na Kanụ bụ dike chọrọ udo ebighị ebi n a mba Africa niile.
N’ihuakwụkwọ Instagram ya ka Yul Edochie nọrọ too onye ndu IPOB bụ Nnamdị Kanụ maka ọganihu na ḿbọ̀ niile ọ na-agba maka nnwere onwe.
Edochie dekwuru n’ihuakwụkwọ twitter ya na taata abụghị ụbọchị ncheta ọmụmụ Kanụ mana ya họọrọ ụbọchị taa iji to ya n'ihi na ọ bụ nnukwu dike ude ya na-ede. Ọ kpọkwara Mazị Nnamdị Kanụ, dike ndị mmadụ na-aghọtahie ugboro ugboro.
Ọ gakwara n'ihu kọwaa na ihe Kanụ chọrọ n'ezie bụ ka ndị Afrịka teta n’ụra ma mee mkpebi siri ike ga-eweta udo ebighị ebi na mba Africa niile. Ọ gọọrọ ya ọfọ ogologo ndụ ma tukwa ya óké mmadụ. O kpebiri n'onwe ya na Chukwu Okike Abịama ga-anonyere Kanụ ma na-edu ya mgbe niile.
Ihe o ji ebunye Kanụ ngọzi ya niile bụ n'ihi mgbọ niile ọ na-aghọ maka nnwere onwe Biafra na ọdịmma ndịda ọwụwa anyanwụ dịka dike bu ụzọ n'ọgbọ ọgụ. Ọ kwanyekwaara Kanụ nnukwu ugwu maka mwube ndị nche ESN (Eastern Security Network) o wubere oge etebeghị aka iji chekwaba mpaghara ọwụwa anyanwụ niile.
Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!