A ga-agbasa sị gbasaa, Chief Chiwetalụ Agụ (Okemmiri Amokwe)

Chiwetalụ Agụ (Okemmiri Amokwe) Chiwetalụ Agụ (Okemmiri Amokwe) Onyoonyoo si na Sahara Reporters

 “Aka ose adịghị mma n’otele – Okwu Chiwetalụ Agụ!

Odogwu a na-eme nkiri na Nollywood bụ Chief Chiwetalụ Agu kwuru na ya na-akwado ka Naịjirịa kewa ma ọ bụrụ na nkewa ga-ewetara mmadụ niile udo.

Ndị okpu igwe nwụchikọrọ Chief Agụ n'izu gara aga n’Upper Iweka Ọnịcha ebe o yi ọgọdọ mwụda nke o ji ọkọlọtọ Biafra kwa ma buru ya laa n'isi ụlọ ọrụ ndị agha Naịjirịa dị n'Enugwu. Ha hapụrụ ya ngwa ngwa mana ndị DSS bụ ndị uwe ojii nzuzo nke Nigeria nwụchiri ya ọzọ wee buga ya Abuja ịza ajụjụ n’ebubo na ọ na-akwado ọgbaghara.

Onye a na-eme nkiri bụ Chief Agụ na onye ntaakụkọ Broadway TV kparịtara ụka mgbe ndị uwe ojii nzuzo bụ DSS hapụrụ ya. Agụ sị n’ekwentị gwa onye ntaakụkọ ahụ na ndị DSS emeghị ya ihe ọjọọ ọ bụla mgbe ha kpọchiri  ya.

N'okwu ya, o kọwara na ihe ekike ya kere na-egọsị bụ ọwụwa anyanwụ na ọ bụghị Biafra, ọ bụghị IPOB nke o ji abụ ESN. Ọ tụkwasịkwara n'elu ya na ọ bụ Ojukwu, Ikemba Nnewi mere ka ọwụwa anyanwụ bụrụ akara njirimara ndị Igbo dịka ndị na-achọ ọganihu mgbe ọ bụla na ebe ọ bụla. Agụ gwara onye ntaakụkọ na onye legharịrị anya n'ime Afrịka ga-ahụ na ndị Igbo na-eme nke ọma site na-ịgba ọke mbọ.

Okemmiri Amokwe kwuru hoo haa na ndị Igbo na-agbara onwe ha mbọ ime nke ọma na-agbanyeghị na Gọọmentị anaghị ele ha anya. Ọ gbakwụnyere n'ezoghị ọnụ na ọ ga-akara ndị Igbo mma ma ọ bụrụ n'ala Naịjirịa ga-ekewa ngwa ngwa n'ihi na o nyeghị elele ndị Igbo na-erite n’ime ya.

Chief Agụ mechiri mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ ahụ site n'ikwu na ọ bụ ihe gbagọrọ agbagọ ịmanye ndị mmadụ ịnọ n'otu nnukwu obodo dị ka Naịjirịa. O kwubiri na ọ dị oke mkpa ịkpọkọta ndị Igbo ọnụ ka e wee were udo gaa n’ihu.

Ekee m bredi kete nga – Chiwetalụ Agụ

Nrụtụaka – Sahara Reporters

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo

A gụọla ya ugboro 655
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!