Ịnụkwa iji agụrụ re nwa naanị narị puku naịra na iri ise (₦150000)

Ịnụkwa iji agụrụ re nwa naanị narị puku naịra na iri ise (₦150000) Onyoonyo si na Vanguard Nigeria

"Sakụsa rie ogwumagala ọ kwụsị iri anụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

A nwụchikọrọ otu nwaada a na-akpọ Mercy Okon maka ire nwa ya dị ọnwa atọ. O rere nwata ahụ naanị narị puku naịra na iri ise (₦150000). Nke dị egwu bụ na ọ ka bụ nwa agbọghọbịa dị iri afọ abụọ na atọ ma ya amụtalarị ụmụ atọ. O kwuputere na ya chọrọ iji ego ahụ akwụ ụgwọ ụlọ ya ma kwụkwa ụgwọ ndị ọzọ ya ji.

Mercy gwara ndị natakụkọ Vanguard na ya ka nwekwara ụmụ abụọ ọzọ ya hapụrụ nne ya kamgbe ya mụrụ nwa ọhụrụ. O kwuru na ọ bụ ụbịam na nkoropụ obi mere ka ya ree nwa ya iji nyere onwe ya aka n’ihi na o nwezighị ihe ya na-eme. Ọ kọwara na nna nwa ahụ hapụrụ ya mgbe ya dị ime ọnwa isii.

Mercy kwukwara na onye hụtara ya gwara ya na nwanne ya nwoke ga-alụ ya ma ọ bụrụ na o kwere. Otu ahụ ka ha siri ghọrịa ma nye ya narị puku naịra na iri ise (₦150000) tupu ya ekunye ha nwa ya ahụ dị ọnwa atọ.

Ọ bụkwanụ mgbe ha na-aghatọrị ya bụ ihe ka ndị uwe ojii nwụchikọrọ Mercy.

Anyị gụtakwara na ndị uwe ojii na-agbasi mbọ ike ijide ndị ọzọ aka ha dị na mkpamkpa ahụ.

Nrụtụaka – Vanguard Nigeria

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1014
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!