Ịyọm Ojukwu arịọla ndị ji iwe hapụ otu APGA ka ha lọghachite azụ

Ịyọm Bianca Ọdụmegwu Ojukwu Ịyọm Bianca Ọdụmegwu Ojukwu

“E gbuo n’iwe, e lie maka isi - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ịyọm Dim Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu bụ Bianca Ojukwu ajaala ndị Anambara steeti ike maka inwe okwukwe na ntọala di ya hiwere site n'ime ka otu APGA nwe mmeri ebe ọ pụrụ iche na ntuliaka gọvanọ nke ka bịara n’isi njedebe.

Ịyọm Bianca Ọdụmegwu Ojukwu bụbu onye nnọchi anya Naịjirịa na Spenu (Spain).

Mgbe ịyọm kelere Ọkammụta Chukwuma Soludo bụ onye a họpụtara ga-abụ gọvanọ ọhụrụ ndị Anambara,  o kwuru na ụdị mmeri ọpụrụiche nke APGA nwere na-egosị na ndị Anambra agaghị ekwe ka ntọala Ojukwu hiwere nwụọ.

Ịyọm Ojukwu gosipụtara afọ ojuju otu ya bụ ntuliaka siri ga ma kelere Chukwu na o nweghị ọdachi ọ bụla daranụ ma ọ bụ tigbuo zọgbuo ọ bụla. N'uhuruchi ntuliaka ahụ ka ọ kpọkuru mmụọ di ya nwụrụ anwụ bụ Ikemba ka ọ bịa duo APGA n’ọgbọ ọgụ nke ntuliaka. “Odogwu bụ odogwu, ma ọ dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ!”

Ịyọm Ojukwu kwuru na ihe ndekọ Soludo gara aga gosiputara na ọ ga-eweta mmepe ngwa ngwa n’Anambara nakwa na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ niile. Ọ na-abụ a hụ nwoke a hụ ogwogwo imi ya.

O kwuru na ya nwere olileanya na Soludo ga-agbasi mbọ ike ime ka APGA kwụrụkwa chịm ọzọ ma kwuo na ọ ga-adị mma iwulitekwa ntụkwasị obi ndị otu APGA site na-ịhụ na e nwere nhaanya nakwa ịkwụwa aka ọtọ n'ọrụ pati ahụ. Nke a pụtara onye tie ọkpọ ya sapụ aka ya ka a hụ na o jighị okwute.

Ịyọm Ojukwu kwesiri ike na nhọpụta Soludo dịka gọvanọ ga-eweta udo ma bụrụkwa kokorokoo okeọkpa APGA nke na-egosi na chi efola n’Anambra. Ọ kpọkuru ndị ji iwe hapụ otu APGA ka ha dajụọ ma kwuo na olileanya dị na ha ga-alọghachite azụ oge adịghị anya ịbịa so nye aka na nhazigharị APGA maka na APGA BỤ NKE ANYỊ.

Agbụrụ, asụsụ na omanala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 981
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!