Gọvanọ Umahi agọọla agụgọ itinye ọnụ na ntuliaka gọvanọ Anambra

Gọvanọ David Ụmahị Gọvanọ David Ụmahị

"Ikwiikwii sụọ nda egwu ejide ụmụ anụmanụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Gọọmenti Ebonyi steeti kwuru ụbọchị Mọnde na Gọvanọ David Ụmahị ekwughị ihe ọ bụla gbasara ntuliaka gọvanọ na steeti Anambara.

Asịrị na-efegharị na soshal midia na-ebo Gọvanọ Umahi ebubo na ọ sị na Gọvanọ steeti Anambara bụ Willie Obianọ, Akpọkuedike na onye na-azọ ọkwa gọvanọ n’okpuru APGA bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo mere magomago na ntuliaka na-aga n’ihu na steeti Anambara.

Na nkwupụta nke onye enyemaka pụrụ iche na mgbasa ozi Ụmahị bụ Mazị Francis Nwaze binyere aka kwupụtara na asịrị ahụ bụ akụkọ ụmụaka.

Gọvanọ Ụmahị na nkwupụta ahụ kwuru na o nweghị mgbe ya jiri jụ mkpebi ọ bụla si na ntuliaka ahụ pụta n'aha otu APC nakwa aha ndị Anambra. Nkwupụta ahụ gara n'ihu kọwaa na Gọvanọ Ụmahị a pụghị ikwu ihe dị otu ahụ n’aha APC ebe ha bụ otu APC nwere usoro zuru oke n’Anambara ma ya bụrụkwuo ebe ntuliaka ebibeghị.

O chetaara onye dere asịrị ahụ nakwa ndị ọzọ na-ebugharị akụkọ adịgboroja na soshal midia na steeti Ebonyi nwere iwu gbasara akụkọ adịgboroja nke e mebere maka ịta ndị omempụ dara iwu ahụ ahụhụ.

Nwaze n’ime nkwupụta ahụ rịọrọ ọhanaeze ka ha leghara asịrị ahụ anya n'ihi na ọ bụghị eziokwu.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 820
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!