Precious Chikwendu sị na FFK tiri ya ihe mgbe ya dị ime

Chikwendu na Kayode Chikwendu na Kayode Onyonyo si na bbc.com

"Ọnụ ọma jụ okproko ọ dị ka ọ jụrụ ọsụkwụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Dịka akwụkwọ akụkọ TheCable Lifestyle siri de, nwunye FFK bụ Chikwendụ agọla agụgụ gọnaghị ebubo eboro ya na o nwere enyi nwoke ma kwukwa na ọ bụ nna ya ukwu FFK na-a kpọbata ụmụ nwanyị n'ụlọ.
Precious sị na ihe ọjọọ ya mere bụ na ya hụrụ FFK n’anya, na-agbachitere ya ma nyekwa ya ọmarịcha ụmụ nwoke ọ mụtabeghị mbụ.

Gụrụ ọnụ mmiri okwu ya dịka ndị The Cable Lifestyle siri de n'akwụkwọ akụkọ ha,
“ FFK kụrụ m ọkpọ n’afọ hienne mgbe ahụ m dị ime diọkpara anyị. Ọ bụrụ na o bido iwe ọkụ ya ọ na-akụ m ọkpọ, ọ na-eti na ya ga-akụpụ m ụmụ ụchịcha m bu n’afọ.

"Nne m na nwanne m nwanyị nọ be anyị otu ụbọchị ọ wakporo m. Ha bara n’etiti anyị igbochi ya ka ọ kwụsị iti m ihe mana o jiri iwe ọkụ kụọ nne m ọkpọ n’isi. FFK nọ ebe ahụ bo nwanne m nwanyị ebubo na ọ kparịrị ya ga kpọchie ya na nke ndị uweojii. Oge ọ bụla m lụghachiri ya ọgụ azụ, FFK na-akpọkọta ndị nche ya ka ha nyere ya aka mesie m ike.

"Ọ kpọla CSP Aisha Yusufu bụ onye isi uweojii nọ n’Asokoro ọtụtụ ugboro ka ya na ndị otu ya bịa kpụrụ m kpọchie. Mgbe ụfọdụ ana m anọ ebe ahụ ọtụtụ awa rue mgbe afọ juru FFK ma ọ bụ ọ dị ya ka m atatala ahụhụ ọnụ m ọ gwa ha kpọghepụ m.
Ọ kpọchikwara ụmụnne m ọtụtụ ugboro ma na-etu ọnụ na ya nwere mmadụ na gọọmentị na o nweghị ihe ga-emenụ. Otu ụbọchị FFK nọ n’ihu ndị ọrụ ya nakwa ndị nche ya gwa ndị uweojii ka ha kụọ m ịga ma gba m ọtọ. Ha gbara m ọgwụ mere m nkubie ume ọtụtụ awa ma tetezie n'ụlọ ọgwụ.

"Mụ bụ ọkpụ isi ya, mụ bụ nọsụ ya, mụ bụ osi erimeri ya, mụ na-ahụkwu na ọ kụrụ ọgọdọ chapụrụ achapụ. Mana iti ihe na ịkparị m ka o ji akwụ m ụgwọ ihe ndị a nille. 
Ihe ọ chọziri ugbu a  bụ ka ọ napụ m ụmụ m ka obi wee gbawa m"

 Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 582
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!