Ndị otu Amnesty ebola Naịjirịa ebubo igbu ọtụtụ ndị mmadụ n'ala Igbo

Ndị ọrụ nche Naịjirịa Ndị ọrụ nche Naịjirịa Onyoonyoo si n'amnesty.org

"Ụkwụ na-aga warawara anya na-aga warawara na-ahụ ya - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Otu mba ụwa na-ahụ maka nchedo na òkè ruuru ndị mmadụ nke bekee kpọrọ Amesty International ebola ndị ọrụ nche Naịjirịa ebubo maka iji aka ike nakwa igbu ebe otu narị mmadụ na iri na ise ma opekampe na mbido afọ a. Ebubo a gbodoro ụkwụ maka aka ike ndị agha Naịjirịa ji egbochi ndị mmadụ ikwupụta mmetụta ha n'ihe gbasara nnwere onwe na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ndị otu a bụ Amnesty International bipụtara nkwupụta nke a n'abalị asatọ nke ọnwa Ọgọstụ (August 8). Ha kwuru na ha nwere ọtụtụ ihe akaebe nke gosịrị na ha bụ ndị ọrụ nche ji ajọ aka ike gbu ọtụtụ ndị mmadụ na-esoghị usoro nke iwu kwadoro.

Mbuso agha ahụ ndị ọrụ nche Naịjirịa na-ebu bụ iji kpagide ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ ndị na-achọ nnwere onwe maka agbụrụ Igbo nakwa ngalaba ọrụ nchekwa mpaghara ọwụwa anyanwụ bụ Eastern Security Network (ESN) ha guzobere iji leba mwagharị ndị Fulani na-achị ehi anya na mpaghara ahụ.

Ha dere na ndị ọrụ nche Naịjirịa emebiela ọtụtụ iwu ma mee mpụ nke megidere iwu mba ụwa na-iji aka ike emenyụ ọgbaghara dị na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kamgbe ọnwa Jenụwarị n'afọ a. Ihe akaebe ndị otu Amnesty International chịkọbara ọnụ na-egosị ajọ ebumnobi nke ndị ọrụ nche nọ na steeti Imo, Anambara nakwa Abịa nwere.

Kamgbe Jenụwarị n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021) ka ndị obu egbe enweghị aha bidoro ụdị mwakpo dị iche iche na akụrụngwa ndị gọọmentị dịka n'ụlọ mkpọrọ na ụlọ ọha gụnyekwa ọtụtụ ndị uwe ojii ha gburu. Ndị otu ọrụ nche ESN ka a na-ebo na ọ bụ ha bụ ndị obu egbe enweghị.

Amnesty International katọrọ ụdị mwakpo ndị ahụ na-aga n'ihu n'ala Igbo. Ha kwuru na otu ihe dị mkpa bụ inwe nyocha kwụ ọtọ eleghị mmadụ anya n'ihu iji chọpụta ihe merenụ ma kpee ndị omekome dara iwu ikpe ziri ezi n'ụlọ ikpe na amaghị onye ọ bụla ikpe ọnwụ.

Ndị ọrụ nche Naịjirịa bidoro arụmọrụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ọnwa June iji lụso ndị ọrụ nchekwa ESN ọgụ ya na ndị dịka ha iji gbasa ya bụ otu nnwere onwe nke ndị mpaghara ahụ chọrọ.

Otu Amnesty International depụtara ebe otu narị mmadụ na iri na ise ma opekampe bụ ndị ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa gburu bido n'ọnwa Jenụwarị ruo n’ọnwa Junu n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021).

Ndị uwe ojii kwuru na e gburu ndị ọrụ nchekwa ihe ruru otu narị mmadụ na iri abụọ na asaa. Ha sị na a wakporo ụlọ ọrụ ndị uwe oji na ụlọ ọrụ ntụliaka ma gbakwa ụfọdụ n’ime ha ọkụ.
Ha kwukwara na ọ bụ na nzaghachi azụ ka ndị ọrụ nchekwa, gụnyere ndị agha, ndị uweojii na ụlọ ọrụ ọgụgụ isi bụ DSS jierela gbuo ọtụtụ ndị obu egbe ma ndị nkịtị ọzọ.

Nrụtụaka; elombah.com

A gụọla ya ugboro 1156
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!