Ndị obu-egbe agbagbuola ndị otu ọrụ nche asatọ na Rivers

Ndị obu-egbe Ndị obu-egbe Onyoonyo si na thenationonlineng.net/

"Onye anarakwana nwata ji ha n'ihi na ọ chara mmanụ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Dịka akwụkwọ akụkọ Vanguard siri de, ndị obu-egbe enweghị aha wakporo ọtụtụ ọdụ nche ndị otu ọrụ nche n'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Eprel n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (24.04.2021) na Steeti Rivers ma gbuo ọtụtụ ndị nche.

Otu onye hụrụ ihe mere nụ ha kpọrọ Chidadi gwara ndị nta akụkọ Vanguard na ndị obu-egbe ahụ enweghị aha wakporo ọdụ nche ndị otu ọrụ nche anọ n'okporo ụzọ awara awara si Owere gawa Igweọcha. O kwuru na ndị uwe ojii anọ, ndị ọrụ Kọstọm atọ na ndị agha ụgbọelu abụọ nwụrụ na ya bụ mwakpo.

Otu onye ọzọ gwakwara ndị nta akụkọ na ndị obu-egbe ahụ enweghị aha wakpokwuru ọdụ nche ndị kọstọm n'ime Isiokpo ebe ha gburu mmadụ anọ ma gbaa ụgbọala vanụ ha okụ. Akwụkwọ akụkọ Vanguard dekwara na ndị obu-egbe ahụ enweghị aha gbupụrụ mmadụ abụọ n'ime ndị ahụ ha gburu na JTF isi.

Anyị gụtara na ndị obu-egbe ahụ enweghị aha zuru otu egbe ndị JTF nakwa otu egbe ndị kọstọm ma tụburu ụgbọala Hilux abụọ ndị kọstọm bu saịrin.

Akụkọ kọkwara na ha gbalịkwara ịgba isi ụlọ ọrụ gọọmentị Ikwerre dị na mpaghara Isiokpo ọkụ mana ndị otu nche mpaghara ahụ bụ Isiokpo Security Planning and Advisory Committee gbara ha mgba.

Ka ọ dị ugbu a, ndị isi uweojii na Rivers steeti kwuru na ọ bụ ihe mere eme ma kwukwa na ha amatabeghị ọnụọgụ mmadụ ole ndị nwụrụ anwụ.

Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze ndị uweojii bụ SP Nnamdị Omoni kwuru na kọmishọna ndị uweojii bụ Eboka Friday ebidola nyocha banyere ya bụ mwakpo iji nwude ndị kpara arụ ahụ.

Agbụrụ asụsụ na omenala Igbo ga-adị.

A gụọla ya ugboro 1329
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!