Lekwa ọnụ mmiri okwu Joe Igbokwe maka njide Mazị Nnamdị Kanụ

Joe Igbokwe Joe Igbokwe Facebook/joeigbokwe.igbokwe

"Onye naanị ya na-aga mposị anyasị na ezu ụkpala mmụọ n'ụzọ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Lekwa ọnụ mmiri okwu Joe Igbokwe maka njide e jidere Mazị Nnamdị Kanụ;

Nnamdị Kanụ nyere ndị otu ya iwu ka ha gbupu mụ na ụmụ m isi ebe ọ bụla ha hụrụ anyị. Ọ hapụkwaghị aha ndị ọzọ na-ekwu ekwugide ala nrọ ya bụ Biafra.
Mgbe ha na-achọgharị m ka m gbabara n'ime Chineke n'ihi na ama m na igbu ikpere n'ala bụ i nwe mmeri. Ndị enyi m na-akpọ, ikwu na ibe na-eti mụ zokpukwa n’ime ụlọ. Ụmụaka m gwa m na m na-etinye ha na nsogbu mgbe niile. Nwunye m kpesagidere ruo mgbe ọ chọpụtara na m enweghị ike ịgbanwe o bido chọwa ihu Chineke ka m. Ụjọ bara ezinụlọ m ahụ. Ndị otu ya bidoro kpọwa ekwentị m na akparị m mgbe ha hụrụ na ha agaghị enwetali m ka ha siri che.

Imirikiti ụmụaka mkpọrọmọnụ na asị Nnamdị Kanụ ji mkparị na ịkpọasị, ajọ mbunobi, echiche mgbe ochie na ịkpa oke agbụrụ zụtọsị ga-abịa n’ihuakwụkwọ Facebook m na-akpọ m ụdị iyi ntị ekwesịghị ịnụ. Ndị a bụ ụmụaka anaghị agụtanwu maọbụ ghọta ahịrịokwu e dere ede. Atara m ahụhụ. Ha malitere ịtụkpo m asị na-amaja m mgbe ha chọpụtara na-enweghị m nsogbu na mkparị ha.
Na mbụ ha sịrị na m dara ada na Legọsị ebe m na-agba ọsọ nwụọ. Ọzọ ha sị na ndị otu IPOB kụrụ m ihe na Legọsị. N’izuụka gara aga ha buru akụkọ na akụrụ m ihe ọzọ bịakwa. Ugboro ugboro ka ha sị na ụlọ m dị na Nnewi gbara ọkụ. Ihe ndị a niile bụ ka ike wee gwụ m mana ha amaghị na ọ bụrụ na m kwenye n'ihe na-anaghị alaghachi azụ.

Kedụ otú m siri mejọ ha? Ekwuru m na ihe kpatara na-achọghị m Biafra bụ na ọ nweghị ike ịkwụdo na narị afọ iri abụọ na otu (21st century). Ma kwukwa na ndị Igbo ekwubeghị uche ha nke ọ ga-eji bụ Nnamdị bụ nwata ga-agwa imirikiti ndị igbo ihe ha ga-eme. Okwu a amasịghị Nnamdị. Arịrịọ m ya ka anyị nwe mkparịta ụka oge ahụ ọ sị na m dị obere ebe ya nọ.
N'ime ọnwa abụọ gara aga, imirikiti ndị ntorobịa nwụrụ ọnwụ n'ụzọ ezighị ezi. O nweghị onye gere ntị na ndụmọdụ m, ndị okenye ji ujọ mechie ọnụ ha maka ụmụaka Nnamdị Kanụ eme gbuo ha. Ndị gọvanọ ndịda ọwụwa anyanwụ ji ụjọ maka mwakpo ghara itinye ọnụ n’okwu. Gọvanọ Hope Ụzọdịmma bụ otu onye tinyere ọnụ ya tara ahụhụ n'ụzọ nke ya. Emere m ihe onyoonyoo iji dọọ ha aka na ntị banyere ọgbaghara ga-abịa n’ihu ma ha wewanyere iwe maka ya.

Ụbọchị Sọnde bụ abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Juun n'afọ puku abụọ na iri abụọ na otu (2021) ka e bughachiri Nnamdị Kanụ azụ na Naịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya na mkpamkpa ọ kpara. Anyị na-achịkọta ihe onyoonyoo arụrụala ya niile dịka mkparị niile ọ kparịrị Naijiria na ndị Naijiria, maka igbu ihe karịrị otu narị ndị uwe ojii, maka ịgba ụlọ ọrụ ndị uwe ojii ọkụ ma mebi ya, maka ịgbawa ụzọ ụlọ mkpọrọ iji tọghapụ ndị nọ mkpọrọ, maka igbu ndị Igbo ekwenyeghị na nke ha na nkịtị, maka izu ihe ndị mmadụ, maka ịgba ụgbọala na akụ na ụba ndị mmadụ ọkụ, maka mwakpo agbụrụ ndị ọzọ n’obere mkpasu iwe, maka igbu Gulak n'ala Imo, maka ịnwe ngwá agha nke iwu akwadoghị, maka iguzobe ndị agha IPOB, maka ESN wdg.

Nnamdi ga -agwa anyị ọtụtụ ihe n'ụlọikpe mgbe oge ruru. Ana m ekele Chukwu zọpụtara m n'aka Nnamdị Kanụ. Alleluia n’elu kachasị elu !!!

Nrụtụaka; Facebook/joeigbokwe.igbokwe

 

 

 

A gụọla ya ugboro 503
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!