Ndị bishọpụ gwara gọọmentị leba anya n'ihe kpatara ọgbaghara

Ndị bishọpụ ndịda ọwụwa anyanwụ Ndị bishọpụ ndịda ọwụwa anyanwụ Onyoonyo si na Daily Times

"A naghị eti nwata ihe sị ya ebekwala akwa – Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Ndị Achịbishọpụ si na ọgbakọ ụka dị iche iche nke ndị otu Kraịst akpọkuola gọọmentị etiti ka ha were ọsọ were ije leba anya n’ihe na-ebute ọgbaghara nke nnwere onwe na mba Naịjirịa.  Ha rịọrọ gọọmentị etiti ka ọ gbaa mbọ mee ka agbụrụ ọ bụla hara ịhaanya nakwa ka a na-enwe ikpe ziri ezi n'ihe gbasara agbụrụ ọ bụla, na ọ jọrọ njọ ma e menyere ogwugwu hapụ nwanosike.

Ndị Bishọpụ kwuru na ọ bụ site na-enweghị ikpe ziri ezi na ikpe nkwụmọtọ mepere ụzọ nkewa agbụrụ dị iche iche. Nke a nyekwara aka iwube ọtụtụ otu maka ikpe ziri ezi na ikpe nkwụmọtọ nke mere ha jiri nweta ọtụtụ ụmụ amaala Naịjirịa bụ ndị enwezighị mmasị n'ihe gbasara Naịjirịa.

Ha kwukwara maka ajọ ọnọdụ ndị ntorobịa nọ n’ala Igbo ma ezinụlọ ha nakwa ọtụtụ ndị mmadụ bi na mpaghara ndịda ọwụwa anyanwụ niile. Ha kwuru na ọ bụ ụdịrị agwa ahụ na-ebutere ndị obodo niile na ndị otu ụka dị iche iche nnukwu nsogbu na ndịda ọwụwa anyanwụ.

Ndị Achịbichọpụ kwuru na ihe emegburu mma bụ Nwamma ka a na-akpọ ya!

Nrụtụaka - Daily Times Nigeria 

Agbụrụ, asụsụ na omenala  Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 1035
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!