Obi amaghị ihe gbasara akwụkwọ mbipụta amamọkwa na-efegharị n'ikuku

Peter Obi Peter Obi Onyoonyo si na Pulse Nigeria

“A na-agbanụ agbanụ aracha aka, aga-afanye ya n’uko – Okwu ndị mbụ na ndị egede!

Maazị Peter Obi onye nke bụọrọna gọvanọ steeti Anambara na onye zọrọ ọkwa osote onyeisiala n’okpuru PDP n'afọ puku iri na itoolu (2019) akwụọla aka Paịleti na ya amaghị ihe ọ bụla gbasara akwụkwọ mbipụta amamọkwa nke ọtụtụ ndị mmadụ na-ekesa n’igwe mgbasa ozi dị iche iche.

Maazị Valentine Obienyem bụ onyeisi mgbasa ozi Maazị Peter Obi na nkwupụta o binyere aka gụpụrụ Peter Obi n’asịrị ahụ nke ọtụtụ mmadụ na-ekesa n’internet. Ọ kọwara na Peter Obi amaghị ihe ọ bụla gbasara akwụkwọ mbipụta amamọkwa ahụ nke na-egosi ya dị ka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala mgbe adịghị anya. O mere ka o doo anya na Obi ezigaghị ma ọ bụ nye onye ọ bụla ikike ibi ma ọ bụ kesaa akwụkwọ mbipụta amamọkwa ahụ.

Obienyem gara n'ihu gwa ụmụ ibe ha atụla ụjọ maka mkpebi ikpeazụ PDP n’ihi na Obi ga-erube isi ma kwenye na mkpebi ikpeazụ maka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala. Ọ kọwakwara na Peter Obi hụbigara pati ya PDP n'anya oke mere na ọ gaghị agbagha otu ọ bụla PDP  siri kpebi.

Nkwupụta ahụ kwukwara na ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na ndị mmadụ bidọrọ ugbu a iche maka ntuliaka na-abịa abịa ebe ọnọdụ Naịjirịa gbagọbara olu na-arịọ enyemaka n’ụdị dị iche iche dịka idozi ọnọdụ nchekwa, ikpochapụ ụbịam na iwube ụlọ ọrụ maka ndị ntorobịa enweghị ọrụ, ịhazi agụmakwụkwọ nakwa ime ka ụlọ ọgwu bụrụ maka onye ọ bụla bi na Naịjirịa. Na nkwubi okwu ya, Obienyem kọwara na ọ dị mwute na ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na o bụ naanị ụdịrị atụmatụ ọganihu dị otu a bụ ihe Peter Obi na-eche maka ya ugbu a.

Nrụtụaka – Vanguard Nigeria

Agbụrụ, asụsụ na omnala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 776
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!