A tọhapụla Metụ n’ụlọ mkpọrọ Kuje

Olisah metụ n'ihu ụlọ mkpọrọ Kuje Olisah metụ n'ihu ụlọ mkpọrọ Kuje Onyonyo si na channelstv.com

"Ori achịsa ọkpa chetakwa na ebere bụ ụgwọ - Okwu ndị mbụ na ndị egede!

A tọhapụla Chief Barr. Olisa Metụ, onye bụbu ode akwụkwọ mgbasa ozi nke òtù National Democratic Party (PDP) n'ụlọ mkpọrọ Kuje dị n'Abụja n'abalị Tọzdee bụ Disemba 24.
A tọhapụrụ ya ka o binenyezuru aka n'akwụkwọ iji mezu iwu niile so na ntọhapụ ya.

A mara Olisah Metụ ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ asaa maka ịnara na ikesa narị nde Naịra anọ si n'aka onye bụbu onye ndụmọdụ nchekwa gbasara obodo (NSA) bụ Colonel Sambo Dasuki [retd].
Ụlọikpe mkpegharị ikpe kagburu ikpe a mara Chief Olisa Metụ ma nyekwa iwu ka e bido ya bụ ikpe ọzọkwa.

Òtù ndị ọkaikpe mmadụ atọ ụlọikpe mkpegharị ikpe guzobere, ji ótù olu kpebie, na mkpebi ikpe ọkaikpe Okon Abang kpere kpegide Chief Metụ n'abalị iri abụọ na ise n'ọnwa Febụwarị, nwere rịkọm.
Ụlọikpe mkpegharị ikpe kwuru na ebubo onye ọkaikpe ụlọikpe kachasị elu ahụ kwunyere n'okwu mkpebi ikpe ya, mebiri ya bụ mkpebi ikpe n'ihi na o gosịpụtawara na echiche ya bụ onye ọkaikpe gbagọrọ agbagọ ebe Metụ nọ.

Ha kọwara na ihe mere ya bụ mkpebi ikpe jiri ghọrọ ikpe ezighị ezi bụ maka na onye ọkaikpe ahu bụ Okon Abang boro Chief Metụ ebubo na ọ na-edebu akwụkwọ mmegide n'ụdị dị iche iche degide ya.
Ọkaikpe Stephen Adah kwubiri n'aha ụlọikpe mkpegharị na mkpebi ikpe, na ha kwenyesiri ike na Metụ na ụlọ ọrụ ya bụ Destra Investment Limited (bụ onye ebubo nke abụọ), enwetaghị ikpe ziri ezi n'ihi na e nyeghị ha ezigbo ohere ịkọwa onwe ha ma ọ bụ gee ha ntị òtù o siri kwesị ekwesị.
O kwenyere na ọ ga-abụ ịtọ ajọ mkpụrụ ma ha hapụ mkpebi ikpe e kpere kpegide onye na-azara ọnụ ya, ma kwukwa na-agbanyeghị na ọ bụ ikpe metụtara mpụ, na o kwesịrị ka ọ bụrụ ikpe nkwụmọtọ.

N'ótù aka ahụ ka ụfọdụ ndị ọkaibe na ndọrọndọrọ sikwara gbarụ ihu ma jụkwa ihe mere e jiri hapụ Metụ n'ụlọ mkpọrọ kamgbe afọ olemaole ebe onye ótú ya bụ Dasuki na-akpagharị kamgbe e nyere ya ikike mgbapụta.

Agbụrụ, asụsụ na omenala Igbo ga-adị!

A gụọla ya ugboro 427
Gaghachi n'elu

Designer Ex@kt Web Clinic!